Nzeribe: Mmegbu butere akwa nwereonwe Ndị Igbo

Ebe foto si, Chuma Nzeribe Facebook Page
Onye bụbu onye na-anọchiteanya Ihiala Federalụ Konstituensi n'ụlọomeiwu nke nta bụ Chuma Nzeribe, kwuru na mmegbu a na megbu ndị igbo gbanyere ụkwụ na iwu ala Naijiria ebe e nyere mpaghara ọdịda anyanwu ugwu Naijiria steeti asaa, ndị ọwụwa anyanwụ nwere nanị ise.
O kwuru na enwekwughị steeti abụọ bụ ọghọm ego ọwụwa anyanwụ kwesiri ịna-enweta site n'akpa gọọmenti etiti.
Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ akụkọ Vanguard nwere, Nzeribe si: "Akwa nwereonwe na-ada n'ala Igbo gbanyere mgbọrọgwụ na mmegbu. A kpachara anya na-akpagbu ndị ọwụwa anyanwụ n'ihe gbasara uru dị n'ọchịchị, mmepe na nnọchiteanya in ọkwa dịga mkpa n'ala anyị.
"Mkpagbu a gbanyere ụkwụ n'iwu ala anyị, ebe e nyere mpaghara ụfọdụ dịka mpaghara ọdịda anyanwu ugwu, steeti asaa, ndị ọwụwa anyanwụ nwere nanị ise.
"Enwekwughị steeti abụọ bụ ọghọm ego ọwụwa anyanwụ kwesiri ịna-enweta site n'akpa gọọmenti etiti. Lele ihe steeti ọbụla na-enweta kwa ọnwa.
"Uche m bụ na a na-agọnarị anyị okpuru ọchịchị iri asatọ(80 LGAs) nke bụ ihe karịị ịbụ nke anyị ma ọ bụrụ na anyị nwekwuru steeti abụọ.
"Ị lee anya n'ego na-abịara steeti na okpuru ọchịchị, na egọ sị n'akpaego gọọmemntị etiti, ị hụ nnukwu ọghọ ndị ọwụwa-anyanwụ na-agabiga."
Ọ gara n'ihu rụọ aka na dịka ndị mpaghara ndị nwere steeti asaa nwere Sinetọ atọ,atọ, nke mere ka ugwu-awụsa sinetọ iri abụọ na otu, ọwụwa-anyanwụ nwere nanị iri na ise.
O kwukwara na iwu ala Najiria mere ka steeti ọbụla nwe otu mịnịsta nke mere na ebe mpaghara ugwu-ọdịda anyanwụ nwere mịnịsta asaa, ọwụwa-anyanwụ nwere nanị ise.
O kwuru na okwesiri ka e si na-imegharị iwu lebe anya na nsogbu ahụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:








