Kanu Nwankwo: A ga m apụta ịzọ ọkwa onyeisiala n'onwe m

Aha onyonyo, Kanu Nwakwo: A ga m apụta ịzọ ọkwa onyeisiala n'onwe m

Nwafọ Igbo gbara Naịjirịa bọọlụ n'oge gara bụ Kanu Nwankwo, ekwuola na aka ya adịghị na akụkọ na-ekwu na ọ na-achọ izọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019.

Kanu kwuru nke a taa na mgbape ihe emume akpọrọ 'Ultimate Football Fans reality Tv Show' nke ndị Soccer Richweb haziri n'ọgbọ egwuregwu dị na Legọs.

Okelere ndị mmadụ maka nkwado ha ma kwuo na ọdịghị na njikere maka ndọrọndọrọ ọchịchị ugbu a.

Emume akpọrọ 'Ultimate Football Fans reality Tv Show' nke ndị Soccer Richweb haziri n'ọgbọ egwuregwu dị na Legọs.
Nkọwa foto, Emume akpọrọ 'Ultimate Football Fans reality Tv Show' nke ndị Soccer Richweb haziri n'ọgbọ egwuregwu dị na Legọs.

"Ka m were ohere a mee ka ndị mmadụ mara na m na-ekele ha maka nkwado ha nyere m.

Mana aka Kanu adịghị na ya, Kanu anaghị adọ ọkwa ọchịchị onyeisiala.

Mana, ihe kachasị mkpa bụ na aṅụtụla mmiri ahụ, ụbọchị ọbụla m dị njikere ị pụta,

a gaghị m achọ ka mmadụ mere m ya, a ga m apụta n’onwe m." Kanu kwuru.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ