You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Premier League: Nke a bụ ọgụ ndị dimkpa
Asọmpị egwuregwu bọọlụ dị icheiche ga-eme na ngwụcha izu a ga-ekpo ọkụ.
N'asọmpị iko Premier League, Leicester City na Stoke City ga-asọ mpi.
Newcastle na AFC Bournemouth ga-asọ mpi nke ya.
Ndị ọzọ bụ Liverpool na West Ham United, na Watford na Everton.
N'egwuregwu nke ụnyaahụ, Ostersunds FK meriri Arsenal ọkpụ abụọ a satara otu.
Arsene Wenger bụ onye nkuzi Arsenal kwuru na mmeri ha meriri Ostersunds FK n'izuụka gara aga bara ha n'isi.
"Anyị amaghị ihe a ga-eji bọọlụ mere, ihe a bụtere anyị nnukwu nsogbu."
Newcastle na AFC Bournemouth
N'asọmpị nke a na-abịa na ngwụcha izu a, onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ bụ Stehen Mbonu gwara BBC Igbo na asọmpị a nwere ike ị ga ụzọ abụọ.
"Bournemouth na Newscastle bụ otu bọọlụ nọ n'ime otu ọnọdụ. Onweghị onye mara onye ga-enwe mmeri."
Liverpool na-agbanị ịba ọkwa anọ nke mbu
Stehen Mbonu kwukwara n'asọmpị ole na ole gara aga, Liverpool ka na-agba ọfụma.
N'asọmpị Liverpool na West Ham United, Stephen nwere olileanya na ndị egwuregwu Mohamed Sala, Sadio Mane ga-eme ọfụma.
"Liverpool nwere nsogbu ndị na-agba bọọlụ na etiti na ndị azụ. Otu a kwesịrị ịzụ ndị egwuregwu ọhụrụ n'oge ahịa n'abịa."