Google akwanyerela Keshi ugwu n'ọnwụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Iji cheta ọmụmụ onye nkuzi bọọlụ Najiria a ma ama bụ Stephen Keshi, Google kwanyere ya ugwu n'ụzọ pụrụiche site na ime ka akara e ji achọta ihe n'igwe intanetị bụrụ ihu ya.

Taa bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Jenuwarị 2018, bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Keshi onye nwụrụ n'afọ 2016 ka ọ gbara afọ 54.

Google Africa kwuru n'igwe okwu Twitter sị: "Taa, anyị na-akwanyere onye egwuregwu bọọlụ a ma ama, Stephen Keshi ugwu. Egwuregwu bọọlụ bugharịrị Keshi ụwa niile dịka onye ọgba bọọlụ na onye nkuzi bọọlụ. Ọnụ ọmụmụ, nna nnukwu!"

Ihe a Google mere, mere ọtụtụ ndị Naijiria obi ụtọ, mekwa ka ha chetakwa ndụ na ike Keshi kpara n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ na Naijiria mgbe ọ dị ndụ:

Mutiu Adepoju, onye ya na Keshi gbakọrọ Naijiria bọọlụ, gwara BBC na, "Keshi bụ onye hụrụ ndị mmadụ n'anya. Echetara m oge m banyere "National Team" mgbe ahụ ọ bụ onye ndu anyị, ọ bụ ezi onye ndu. Keshi bụ onye a ma ama. Ọ nọzịghị ndụ mana a ga-eji ihe ọma ndị o mere mgbe ọ dị ndụ were na-echeta ya."

Keshi chịrị ndị otu egwuregwu Super Eagles kemgbe afọ 2011 ma durukwa ha gaa asọmpi dị iche iche nke gụnyere; Iko Mba Afrika na 2013 (nke ha bulatara Naịjirịa), iko mpaghara Afrịka dị iche iche na 2013, ma nye aka wetara Naijiria ọnọdụ n'asọmpi Iko Mbaụwa niile na 2014.