Iwu ọhụrụ: ‘Onye kwụọ ndị ntọrọ ụgwo mgbapụta, ọ gaa nga ruo afọ 15’ - Ụlọomeiwu Naịjirịa

Ndị omeiwu Naịjirịa chọrọ ka ndị na-akwụ ụgwọ mgbapụta gaa mkpọrọ

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọomeiwu Naijiria ewepụtala iwu ọhụrụ kwuru na onye ọbụla kwụrụ ndị omekome ụgwọ mgbapụta iji tọhapụ onye a tọọrọ ga-aga nga ruo afọ iri na ise.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọ atụmatụ a ma na-ekwu na nke a ezighi ezi ebe ọ na-emegide ndị na-achọsi ike ịgbapụta ndị ikwu ha.

Iwu a nke a na-eche ka Onyeisiala Muhammdu Buhari binye aka nakwa ka ụlọomeiwu nta tinye ọhụ, ga-ahụ na onye ọbụla e jidere na-atọ mmadụ ga-aga nga mkpụrụ ọka maọbụ nata ikpe ọnwụ.

Kemgbe ihe karịrị afọ iri, Naịjirịa na-agbasi mbọ ike ime ka ndị otu ji egbe na-atọọrọ ndị mmadụ aghara aghara ma na-anapụ ndị ikwu ha ego mgbapụta kwụsị ọrụ ha mana nke adịbeghị ire

Central African Republic (CAR) anabatala iji 'Bitcoin' eme azụmahịa ha

Bitcoin/Central African Republic

Ebe foto si, Reuters/Getty Image

Central African Republic (CAR) anabatala iji ego ọgbara ọhụrụ nke teknụzụ 'Bitcoin' azụ ma na-ere ahịa na mba ha.

CAR bụ mba nke abụọ na-ejizi Bitcoin mere ego ha, mba mbụ bụ El-Salvador dị na South America.

Aha onyonyo, Ndị mmadụ aghọtaghị ihe goọmentị mere maka Cryptocurrency.

CAR bụ otu na mba n'ụwa kachasị daa ogbonye mana ha nwere ọlaedo 'uranium'.

Tigbuo-zogbuo adaala na mba ahụ nke ya na mba Rọshịa dị na mma ọtụtụ afọ.

Ndị ọmeiwu mba ahụ binyere aka ka e jiri Bitcoin mewe ego ha ugbua.