Tottenham vs Man United: Ha abụọ eshitela otu pọịntị n'ajọ ọnwụ

Ndị egwu bọọlụ Man Utd ebe ha na-agba

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Tottenham ji otu ọkpụ goolu sị ndị Manchester United "nnọọ" dịka ha nabatara ha n'azụ ụlọ ha, mana Man Utd mechara zọta isi onwe ha.

Goolu ndị Tottenham si n'aka Steven Bergwijn na nkeji 27 e ji malite ya bụ egwuregwu, gosiri Man Utd na Jose Mourinho bụbu onye nchịkọta ha anabataghị ha n'ụlọ ọhụrụ ya ka ọ gbaa ha nkiri.

N'agbanyeghị na ọ bụ a gbatu gbatu a ṅụọ mmiri, otu abụọ a nwara ike ha ịma ndị ga-azọta pọịntị mgbe a ga-egbuchi bọọlụ.

Na nkeji 81, Bruno Fernandes ji penariti nyere Man Utd goolu dịka Eric Dier kwaturu Paul Pogba, mere ka ọ bụrụ onye lawa onye lawa.

Mwebata e webatara Pogba gbanwere egwu ndị Man Utd, mee ka ha kpawakwa ike.

Na nkeji 78, e webatara Odion Ighalo bụ nwaafọ Naijiria na-eme ndị mmadụ obiọma nso nso a, mana ọ gbaghị aka ahịa ruo mgbe e gbuchiri bọọlụ.

Na nkeji 90 na ụma, ndị Man Utd tikwara mkpu ka e nye ha penariti oge ọ bịara dị ka Dier ọ gbaturu Bruno, mana ihe nkiri enyemaka Video Assistant Referee (VAR) nyochara ya sị na otu abụghị n'ezi.

Cheta na mgbe otu abụọ a zutere tupu ọrịa Coronavirus achụkpuo onye ọbụla n'ime ụlọ, Man Utd ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Tottenham n'Old Trafford.

Akụkọ ga-amasị gị: