Everton vs Arsenal: Ljungberg emeela ike ya mana ozughị

Freddie Ljungberg

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Freddie Ljungberg ga-apụrụ Mikel Arteta n'oche taa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ihu atọghị ndị nkwado otu egwubọọlụ Arsenal na Everton ọchị taa ka otuegwu bọọlụ abụọ ahụ gbara ọnyụpa na Premie Lig ụbọchị Satọde.

Agbanyeghị, ndị otu abụọ ahụ nụrụ ọgu ka agụowuru abụọ meruru ahụ ebe ọgụgụ sị na ndị Arsenal jidere bọọlụ ihe ruru 57% ebe Everton ji ya 43%.

Asọmpi a bụ nke mbụ nke ikpeazụ Freddie Ljungberg ga-eji nyere Mikel Arteta ohere dịka onyeis nkuzi ndị Arsenal.

Otu ekwubọọla abụọ agbaghị aka ahịa site na mbido ya bụ egwuregwu ruo na ọgwụgwụ ya nke bụ na ụfọdụ che na ọ bụ ya bụ asọmpi kacha njọ kemgbe agbawara Premia Lig.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ihe atụrụ anya n'aka Mikel Arteta karịrị akarị ọkachasị ikpogote Arsenal n'ogogo Premia Lig bụ ebe ha na-agba ndị nke itoolu.

Onye jigodi oche onyenkuzi ndị Everton bụ Duncan Ferguson na-aja onwe ha ike na-ekwu na ha mere ike ha ịhu na Arsenal emerighị ha n'ụlọ.

Nke a bụ ugboro atọ emeribeghị ha n'asọmpi.

Obi juru ya afọ maka ihe ndị otu ya gbara taa, agbanyeghị na ha emerighi, ebe ọ na-atụanya ịnabata onye ndụ ọhụrụ ha bụ Carlo Ancelotti echi.

Egwuregwu a ka ndị na-anọchite anya ndị nkuzi otu abụọ a bụ Freddie Ljungberg na Duncan Ferguson ga-eji nyere ndi isi ha efe n'oche.

Ndị nkuzi abụọ a nọkwanụ n'ụsọ ekiri ihe ndị otu ha mere n'ọgbọ bụ ebe ha ga-anọ mara ihe ha ga-eme iji mee ka ọnọdụ ha gbagote.

Ọnweghị ndị nwere ibe ha goolu ka ya bụ asọmpi gwuchara.

Akụkọ ga-amasị gị