Onye ga-anọchị Arsene Wenger na Arsenal?

Ebe foto si, Getty Images
Asọmpị dị iche iche n'egwuregwu bọọlụ na-akwakọ ọnụ ugbua, dịka ka anyị si mara, Arsene Wenger bụ onye nchịkọta Arsenal ekwuola na ya ga-eritu n'ọkwa ya dika onye nchịkọta otu ahụ.
Onye ọzọ kwuru na ya ga-apụ na ngwụcha afọ egwuregwu a bụ Unai Emery, bụbụ onye nchịkọta otu Paris Saint-Germain.

Onye na onye were ike ịpụ n'ọrụ ha
Ndị ọzọ anyị na-eche na ha ga-apụ n'ebe ha na-eme nchịkọta ugbua bụ ndị a:
Massimiliano Allegri

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ onye nchịkọta Juventus ugbua mana akụkọ dị iche iche na-ekwu na anya ya nọ n'ọkwa nchịkọta Arsenal.
Luis Enrique
Enrique bụ onye chịkọtara Barcelona n'oge garaaga. Akụkọ kwukwara na anya ya ka dị n'otu Arsenal.
Jurgen Klopp

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu Liverpool bụ onye ọzọ a na-ele anya ma ọ ga-apụ gawa Arsenal maka ọrụ Arsene Wenger.
Mikel Arteta
Arteta bụ onye ọzọ a na-atụ aka ma ọ ga-abụ onye ga-anọchị anya Wenger n'Arsenal.
Ndị ọzọ anyị na-ele anya ma ha a ga-apụ ebe ha nọ ugbua bụ ndị nchịkọta otu dịka Stoke City na Westbrom.
Nkea bụ maka ha abụọ apụọla n'ime ndị na-agba asọmpị Premier League ugbua.










