You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
COZA Pastor Vs Busola Dakolo: Lee ihe ụlọikpe kpebiri
Dịka ụlọikpe kụchapụrụ akwụkwọ Busola Dakolo gbara onyeisi ụlọụka COZA bụ Biodun Fatoyinbo maka ebubo ịwakpo ya n'ike, Busola ekwuola na ya ga-agbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị.
Ọkaikpe Othman Musa onye kpere ya bụ ikpe kwuru na e nweghị ihe nọ n'ime ya n'ihi na o teela aka ya bụ ihe mere afọ iri na isii gara aga mere.
Dịka akụkọ ahụ pụtara , obi adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma n'ihi na hụtara ya na ọ ga-eme ka ndị a wakporo n'ike na-atụ egwu kpọpụta onye metọọ ha.
Ọtụtụ ndị na-akwado ụkọchukwu COZA na-enwe aṅụrị maka mkpebi ahụ.
Mana Busola site n'akwụkwọ mgbasaozi ọkaiwu ya bụ Pelumi Olajengbesi binyere aka kwuru na ọkaikpe ahụ elebanyeghị anya n'isi okwu akwụkwọ ahụ ha gbara.
O kwuru na-agbanyeghị akụkọ na-eduhie ụzọ nke na-efegharị nke kwuru na aka Fatoyinbo dị ọcha, na nke bụ eziokwu bụ na "e lebanyebeghị isiokwu anya."
"Ihe BIODUN FATOYINBO, na-ekwu site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya bụ ka ụlọikpe ghara ilebanye anya n'okwu n'ihi na ọ bụ ihe mere oge tereela aka."
"Ya mere anyị ga-aga n'ụlọikpe dịkarị elu ka ha nyonye anya n'okwu ahụ."
Cheta na ọnwa ole na ole gara aga, Bussola , onye bụ nwunye otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo kwụpụtara na mkparịtaụka ya na otu ụlọọrụ ntaaakụkọ nwere na Fatoyinbo wakporo ya oge ọ dị n'obere.
Akụkọ ga-amasị gị: