COZA: Nathaniel Bassey o kotela ebu maka okwu ụlọụka a?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye otiegwu amaama bụ Nathaniel Bassey etinyele ọnụ n'ihe gbasara okwu nwakpo dị na etiti Busola Dakolo na onyendu COZA bụ Biodun Fatoyinbo.

Ọ mere ihe onyonyo a na-akpọ "instagram Live", ma were ohere ahụ were kwuo obi ya na okwu nwakpo ahụ.

Dị ka ọ mechara nkea, ụfọdụ ndị mmadụ na-eto ya ma ebe ụfodụ na-akatọ ihe o kwuru.

Lee nchikota ihe okwuru.

Lee ihe ndị mmadu nwere ikwu maka okwu Nathanjiel Bassey n'igwe twitter.

Ekweteghi m n'aro nke anọ, ndị okenye n'elekọta ụka ekwesighị ikpe ikpe gbasara mpụ maka nkea bụ ọrụ ndị gọọmenti kama ha nwere ike ikpe ikpe gbasatara omụme.

Ihea abụghị olileanya m ebe Nathaniel Bassey nọ.

Enweghị ihe di njọ na nchịkọta ihe Nathaniel Bassey kwuru . . . e kwenyere'm, kwesie ike.

Nathaniel Bassey gbuwara ya nke ọma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: