Cashless Policy: Eziokwu dị na atụmatụ ọhụrụ a CBN wepụtara

Onyeisi 'CBN' na igwe a ji adọrọ ego bụ 'ATM'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisi 'CBN' na igwe a ji adọrọ ego bụ 'ATM'
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọtụtụ mmadụ na egosi mwute gbasara atụtụmatụ ọhụrụ ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank of Nigeria' wepụtara nke a kpọrọ 'cashless policy' na Bekee.

Atụmatụ a ga eme ka amịpụ ego dị pasentị abụọ ma ọ bụrụ na mmadụ gaa ịdọrọ ego karịrị puku narị naịra ise (N500,000) otu mgbe n'ụlọakụ ya.

Onyeisi ụlọọrụ CBN bụ Godwin Emefiele kọwara na atụmatụ a bụ iji mee ka ndị mmadụ ghara ị na-ebugharị ọkpụrụkpụ ego n'aka.

Emefiele kwukwara na ọbụ iji mee ka ndị mmadu gbasoo ụzọ isi n'ikuku maọbụ n'akara ịntanetị maọbụ akara ekwentị wee na ezipu maọbụ na-anabata ego.

Mana ọtụtụ kwuru na atụmatụ a ga-eme ka ihe isiike rịwanye elu na Naịjiria.

Ọtụtụ aghọtachaghị ya bụ atụmatụ, ha amaghịkwanụ etu ọ ga-esi adị ire.

'Cashless policy' ọ bụ ihe ọhụrụ?

Lamido Sanusi bụ onyeisi CBN bido na 2010 ruo 2014

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụ mgbe Lamido Sanusi bụ onyeisi CBN ka o wepụtara atụmatụ 'cashless policy'

Ụlọọrụ CBN kọwara na ọtụtụ mmadụ ghọtahiere atụmatụ 'cashless policy'.

Ha kwukwara na atụmatụ a abụghị ihe ọhụrụ kama na ha chọrọ ka ọ dizie ire nke ọma ugbua.

N'eziokwu, onye wepụtara atụmatụ 'cashless policy' bụ Sanusi Lamido Sanusi oge ọ bụ onyeisi CBN.

Atụmatụ a malitere n'abalị mbụ nke ọnwa Janụwarị afọ 2012 na steeti Legọs.

N'ọnwa Julaị afọ 2013, e bidoro ya na steeti Abịa, Anambara, Kano, Ogun, Rivas nakwa Abuja.

N'ọnwa Jụlaị afọ 2014 ka ọ gazuru obodo Naịjiria ọnụ.

Otu atụmatụ cashless policy ga-esi rụọ ọrụ

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Iwu CBN nyere ugbu a bụ na onye chọrọ ịkwụnye maọbụ ịdọrọ ego karịrị puku narị naịra ise n'ụlọ akụ otu mgbe, a ga-amịrị pasentị abụọ.

Mana pasentị abụọ ahụ bụ n'elu ego nke mara ama, ọbụghị n'elu puku narị naịra ise ahụ.

Iji maa atụ, onye chọrọ ikwụnye N520,000, pasentị abụọ ọ ga-akwụ bụ n'elu N20,000 nke mara ama.

Pasentị abụọ 20,000 pụtara narị anọ (400).

Ya bụ, a ga-amịpụ narị naịra anọ n'ime N520,000.

Nhịahụ ga-adị na atụmatụ a

Akwụkwọ ozi CBN na-ekwu maka 'cashless policy'.

Ebe foto si, CBN Website

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi CBN na-ekwu maka 'cashless policy'.

Ụfọdụ ndị ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara akụnụba na ego ekwuola na atụmatụ a ga ara ahụ.

E nwere ndị kwuru na ihe dị otu a nwere ike ịme ka obi lọọ ndị mmadụ mmiri itinye ego ha n'ụlọakụ.

Ndị ọzọ kwukwara na ọtụtụ ụzọ e si eji ịntanetị ezipu ego anaghị arụcha ọrụ nke ọma.

Ebe ndị ọzọ kwukwara na ego a na-amịpụ n'akara ọbaego ndị mmadụ akarịala.

Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ kwuru:

@DrJoeAbah katọrọ atụmatụ ahụ ma jụọ ndị CBN ma ha che na Naịjirịa ka nọ n'ọchịchị ndị agha.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@OgbeniDipo jụrụ ihe kpatara ọ ga-eji kwụchaa ụgwọ dị icheiche maka ego ya dị n'ụlọakụ bịakwa kwụọ ụgwọ ọzọ ma ọ chọọ ịdọrọ ego ahụ

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ebee na ebee ka a ga-amalite atụmatụ a?

Ka ọ dị ugbu a, atụmatụ cashless policy a ga-adị ire naanị na steeti Abịa, Anambara, Kano, Legọs, Ogun, Rivas nakwa Abuja.

N'ọnwa Maach afọ 2020 ka ọ ga-ebiri ọkụ na Naịjirịa niile.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: