Helicopter pick-Up: 'E ji ụgbọelu helikọpta zọọ onye nwere ọrịa nkpọnwụ ahụ ndụ'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọọrụ ụgbọelu ekwuola na ha fepuru nwoke nwere ọrịa nkpọnwụ ahụ site na nnukwu kpachikpachi okporoụzọ si Legọs gawa Ore.

Ihe onynyo pụtara n'ụbọchị ụka na soshal midia na-ekwu na otu ọgaranya eriwe agwụ agwụ kpọrọ ụgbọelu helikọpta ka ọ bịa bupu ya na kpachikpachi okporoụzọ ruru awa anọ.

Ihe onyonyo ahụ kpasuru ọtụtụ ụmụ Naiijria iwe ndị nọ na-akatọ ihe mere.

Mana ụlọọrụ nwe ụgbọelu ahụ kwuru na ha zara oku gbagbata sị n'aka onye nọ n'oke mkpa.

Ụbọchị Wenezde, ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu a kpọrọ 'Nigeria's Civil Aviation Authority ' kwuru na ha na-eme nyocha maka ihe mere.

Femi Adeniji, onye ọrụ Tropical Arctic Logistics Ltd bụ ndị nwe ụgbọelu ahụ gwara BBC na ya aghọtaghị ihe mere onyonyo ahụ ji akpọtụ akpọtụ.

O kwuru na ha na-arụ ụdị ọrụ ahụ kwa daa dịka ha fepụrụ mmadụ isii n'ime ọnwa abụọ gara aga.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: