You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
AFCON Group F Result: Cameroun achụpụla Guinea-Bissau ajọ mmụọ n'anya
Otu 'Indomitable Lions' nke Kamerun ewerela ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Gini Bissaụ na mmalite njem ha na asọmpi AFCON 2019.
Goolu nke mbụ si n'aka Yaya Banana wee bia na nkeji 66, ebe Stephane Bahoken nyere nke abụọ na nkeji 69.
Mmeri a enyela Kamerun akara atọ iji bụrụ ndị nke mbụ na 'Group F'.
Kamerun na Gana ga-ezute onwe ha n'ụbọchị Satọdee abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Juun.
N'egwuregwu nke ọzọ e nwere taa, otu egwu mba Gana na ndị Bene Repọblik zutere onwe ha ma were goolu abụọ gbaa onwe ha onye lawa, onye lawa.