You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Leicester City: Ụgbọelu Helikọpta onye nwe ya akpọriela
Ụgbọelu Helikọpta onye nwe otu egwuregwu bọọlụ Leicester City akpọkasịala dịka ọ na-achọ i si n'ọgbọ egwuregwu ha efepu ụnyaahụ.
Akụkọ kwuru na Vichai Srivaddhanaprabha bụ onye nwe otu bọọlụ Leicester City nọ n'ime ụgbọelu ahụ mgbe ọ dara n'ala.
Leicester City bụ ebe ụmụ Naịjirịa abụọ bụ Kelechi Iheanacho na Ndidi na-agba bọọlụ gbachara asọmpi ha na ndị West Ham United tupu nke a e mee.
Amabeghi mmadụ ole ọzọ nọ n'ime ụgbọelu helikọpta ahụ mgbe nke a mere.
Anya hụrụ ka ihe ji mee sị na akụpe ọdụ ụgbọelu helikọpta ahụ kwụsiri ịrụ ọrụ nke mere o ji kpọkasịa.
Onye ọzọ hụrụ ya kwuru na injini helikọpta ahụ kwụsiri ịrụ ọrụ tupu o si n'elu daa.
Vichai Srivaddhanaprabha goro Leicester City n'afọ 2010 mana e rue n'afọ 2016 ha mabute Iko asọmpi Premier.
Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere otu Manchester City na-ezigara ha ozi nkasi obi.
Ndị ọzọ na-ezigara ha ifuru.