You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọọrụ onyeisiala akatọọla PDP maka ikwu na Buhari ga-egosirịrị asambodo ya
Akụkọ ndị dị mkpa taa
Ụlọọrụ gọmentị etiti ekwuola uche ha maka asambodo Buhari
Ụlọọrụ onyeisiala agwala ndị na-esi onwu maka iwepụta asambodo Muhammadụ Buhari ha ga gbara ọgwụ ha ṅụọ.
Odeakwụkwọ mgbasa ozi Onyeisiala Buhari bụ Femi Adesina kpọrọ ndị na-eme otu ndị ọnọnkịtị enwe efe.
ACF asaala Nnamdị Kanu
Ndị otu Arewa Consulative Forum echerela Nnamdị Kanu bụ onye ndu Ipob aka mgba maka okwu ọ tụpụrụ ha na okwu mbụ ya kemgbe ọ pụtara ihe.
Onyeisi otu ahụ bu Yerima Shettima kwụrụ na okwu Kanu maka ịkewe Naịjirịa bụ mba a na-abara agụ.
N'ofesi, akpọpụtala aha ndị egburu na nwakpo ahụ emere na ụlọnzụkọ nke Pittsburgh na mba Amerika.
Ụmụnwanne abụọ na di na nwunye so na ndị isi ha alara na ya bụ nwakpọ nke mmadụ iri na otu (11) nwụnyụrụ anya pii.
Chelsea ji ọkpụ anọ zuo Burnley ike n'ahụ tata
N'egwuruegwu, Chelsea ewerela ọkpụ anọ a asataghị otu duo ndị Burnley ụlọ na-egwuruegwu ha gbara tata.
N'otuaka ahụ, Crystal palace na Arsenal ji ọkpụ abụọ gbaa onwe ha onye naba onye naba.
Họpụtanụ ndị ndu gụrụ akwụkwọ - Sanusi
Onye Emir nke Kano bụ Muhammed Sanusi n'ime emume mpụta n'ụlọakwụkwọ nke Mahadum Nile dị na Naịjirịa bụ nke e mere ụnyaahụ kwuru na ọtụtụ ndị ndu Naịjirịa bụ ndị na-agụghị akwụkwọ.
O Kwuru ka ndị Naịjirịa saa anya ha na mmiri n'ịhọpụta ndị ndu gụrụ akwụkwọ ma mara uru dị n'agụmakwụkwọ.
Ndị iro m chọrọ igbu m - Nwoye
Onyeisioche Pati APC n'Enugu Steeti bụ Ben Nwoye a gbanarịla ọnwụ ya dịka ndị oji egbe wakporo ụlọ ya dị n'Independent Layout nke Enugwu Steeti.
Nwoye kwuru na ndị a wakporo ndị uweojii na-echekwa ụlọ nche ya ma merụọ otu onye n'ime ha ahụ bụkwanụ onye na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.
N'ofesi
A gbagbuola mmadụ iri na otu n'ụlọ nzukọ a kpọrọ 'Tree of Life' dị na Pittsburgh nke Pennsylvania mba Amerịka dịka ha na-eme ofufe nroh.
Onye a na-eche mere nke a bụ otu nwoke a kpọrọ Robert Bowers dị afọ iri anọ na isii bụkwanụ onye nọ n'aka ndị uweojii ugbua.
N'egwuregwu
Ụgbọelu Helikọpta onye nwe otu egwuregwu bọọlụ Leicester City akpọkasịala dịka ọ na-achọ i si n'ọgbọ egwuregwu ha efepu ụnyaahụ.
Cheta na Leicester City bụ ebe Kelechi Iheanacho na Ndidi na-agba bọọlụ gbachara asọmpi ha na ndị West Ham United tupu nke a a na-eme.
Gee Nkeji nke ụtụtụ a: