You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Anyị ga-akwado onyeisiala ga-enye anyị nnwereonwe'
Akụkọ dị mkpa:
Ndị ọchịchị imeobodo achọghịzị ịnọ n'okpuru gọọmentị steeti
Otu kpọrọ onwe ha All Former Councillors Forum of Nigeria (AFCFN) ekwuola na onye ọbụla ha ga-akwado maka ọkwa onyeisiala ga-abụ onye ga-ahụ na ọchịchị imeobodo ga-anọrọ onwe ha nke Bekee kpọrọ "autonomy", ọkachasị ebe ọ gbasara ọchịchị na akụnaụba obodo.
Nke a na-abịa ka otu ndị Association of Local Government Chairmen ga-ebido ọgbakọ ebe ha ga-akpa maka ya bụ nnọrọ onwe n'Abuja n'ụbọchị Toosde na-abịa.
Cheta na n'ọnwa Epreelụ 2018, Onyeisi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki gosiri nkwado o nwere ebe gọọmentị imeobodo ịhapụ ịnọ n'okpuru gọọmentị steeti nọ.
Na mba ofesi,
Ihe ruru mmadụ iri anọ emerụọla ahụ ka nnukwu ọkụ gbapụrụ n'otu ụlọoriri dị n'obodo Sapporo dị na mba Japan.
Ndị uweojii obodo ahụ sị na ha amabeghị ihe butere ọkụ ọgbụgba ahụ, mana ha emechiela ebe ahụ maka a na-atụ ụjọ ma a ga-enwe ọkụ ọzọ ga-agbapụ.
N'egwuregwu,
Onye egwu na-ejikọta otu Stuttgart bụ Christian Gentner, nọ n'iru uju ka ọnwụ kpọrọla nna ya bịara ile ya n'ọgbọ egwuregwu ka ha na Hertha Berlin zutere n'ụbọchị Satọde.
N'aka ọzọ, Otu Chelsea bụ ebe nwaafọ Naịjirịa bụ Victor Moses na-agba bọọlụ, ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Brighton bụ ebe Leon Balogun na-agba.
Ebe otu Southampton ji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie Arsenal bụ ebe nwaafọ Igbo bụ Alex Iwobi na-agba, ka ha zutere na Premier League.
Mmeri e meriri Arsenal mere ka "agba agba emeri emeri" ha ruru egwuregwu 22, bịa n'isi njedebe.
Abụbụ ọrụ ndị Parliamentary Staff Association of Nigeria
Otu ndị ọrụ ụlọọmeiwe kpọrọ onwe ha Parliamentary Staff Association of Nigeria etiela aka n'ala na ha aghaghị ịgba abụbụ ọrụ nke ha kwadoro ibido ụbọchị Mọnde ma gọọmentị akwụghị ha ụkwọ oruoro ha.
Onyeisi ndị otu a bụ Musa Bature mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ụbọchị Fraịde sị na nke a bụ abụbụ ọrụ ịdọ aka na ntị nke abalị anọ.
Ndị Uweojii akparala ndị a na-eche ka ha abụ omekome
Mbọ gọọmentị Anambra steeti na-agba maka nchekwa obodo amalitela ịmịta mkpụrụ dịka aka ndị uweojii kpatara ndị isiekwe ọnwụ a na-eche na ha bụ ndị oji egbe ezu n' Ogidi.
Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwụrụ ndị uweojii n'Anambra steeti sị na ha na ndị uweojii kwakọrịtara mgbọ tụpụ ha ejide ha ebe mgbọ merụrụ otu onye n'ime ha ahụ.
Maka mgbanwe mbara eluigwe
Liverpool na Man U ga-akwata na mgbede taa
N'egwuruegwu, Jurgen Klopp nke Liverpool chọrọ ka ndị otu ya were iwe na ọnụma mgbe ha na Manchester United ga-akwata na mgbede Sọnde.
Liverpool ga-anaghara Man City ọnọdụ nke mbụ na lig ma ọ bụrụ na ha emerie ya bụ asọmpi.
Gee akụkọ BBC na nkeji