You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Idris ekwuola sị kpọghachite ndị uweojii na-eche ndị nkịtị
Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim Idris enyela iwu ka akpọghachị ndị uweojii niile na-eche ndị nnukwu mmadụ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị ọcha nọ na Naịjirịa nche.
Idris kwuru na ọ ga-edegara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari, akwụkwọ iji nweta nkwado ya, nke a ga-eji mere ntuziaka eji edupu onye uweojii ozi nchekwa ndị nnukwu mmadụ.
O kwuru nke a na nzukọ ya na ndị Kọmishọna ndị uweojii na ndị uweojii ndị ọzọ ọkwa ha gbalitere, nwere n'isi ụlọọrụ ha n'Abuja ụnyaahụ.
Idris kwuru na iji hụ na ndị mmadụ mere ihe o kwuru, na etinyela ihe bekee kpọrọ task force nke Adamu Dankwara bụ osote kọmishọna ndị uweojii bụ onyeisi ya.
O kwukwara na o nyere iwu ka ndị uweojii bido ime ihe a n'etufughị oge ọbụla.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Idris kwuru sị "Maka nsogbu anyị na-enwe na Naịjirịa gbasara nchekwa, ọ dịla ezigbo mkpa ka ndị uweojii Naịjirịa wetuo aka n'etu ha si ezipu ndị otu ha n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị nnukwu mmadụ.
"Maka nke a, m ga-edegara onyeisiala akwụkwọ iji nweta nkwado ya nke a ga-eji mere ntuziaka eji edupu onye uweojii ozi nchekwa ndị nnukwu mmadụ nọ n'ime mba a.
Etu ahụ, enyela m iwu ka akpọghachite ndị uweojii niile ezipuru ka ha na-echekwa ndị nnukwu mmadụ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị na-arụ n'ụlọọrụ ọha."