Osisioma: Ọkụ gbara wutere Buhari nke ukwu - Garba Shehu

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, @GarShehu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọnụ na-ekwuchitere Buhari esila n'akara ozi ya na Twitter zipụ ozi maka ihe mberede mere n'osisioma ebe ọkụ mmanụ agbidi gbagburu ọtụtụ mmadụ.

O kwukwara na ihe ọdachị ahụ malitere mgbe ndị gara ohi mmanụ bidoro ịlụ ọgụ n'ime onwe ha nke kpatara na agbapụrụ egbe, mmanụ were nwuru ọkụ gbagbuo ndị mmadụ.

O kwuru na oteela aka ndị a na-emebi okporo mmanụ na-enye gọọmentị nsogbu nakwa na ha jisike eme ya n'agbnyeghị na adọọla ha aka na ntị ha kwụsị ya.

Isiguzoro na Atiku

Ebe foto si, Mazi Okechukwu Isiguzoro Facebook page

Nkọwa foto, Obi adịghị Ohaneze ndị Igbo mma maka etu esi neni ndị Igbo na Naịjirịa

Cheta nd ndị ọchịchị ohaneze ndị Igbo mbaụwa niile rịọrọ onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ka ọ ṅyomie onye bụbụ osote onyeisala na Naijirịa, aha ya bụ Atiku Abubakar site na ịga leta ndị ọkụ gbara n'Abia steeti.

Ụbọchị Oktoba iri na abụọ ka ọkụ gbara ọtụtụ mmadụ karịrị iri na ise n'Osisioma di n'Abia steeti.

Ndị a gụnyere ndị agha, nwaanyị kụ nwa n'aka nakwa dị na nwunye nọ n'ulọ ha.

Peter Obi bụ onye ya na onye na-azọ oche onyeisiala na pati PDP, Atiku Abubakar gara n'aha Atiku ga leta ndị a ọkụ gbara ma nye ha ma kasie ndị ihe a metụtara obi.

Atiku nyekwara ha ego ruru nde naira iri ka wee nweretụ onwe ha.

Aha onyonyo, Abia fuel explosion: Di na Nwunye bi n'ụlọ m rere ọkụ

N'ime akwụkwọ onyeisi Ohaneze bụ Okechukwu Isiguzoro depụtara ndị ntaakụkọ, otu ahụ kelere Atiku maka etu o si gosi obioma ya na ebe ndị ihe mberede a mere.

Ha jikwa ohere a dọọ aka na ntị maka ndị na-esi azụ ezu ụgbọala ha kwụsị ya makana ha na-eche na onwere ike ị bụ ya kpatara ọkụ ọgbụgba.

N'okwu ha, "Ohanaeze ndị Igbo mbaụwa niile na-akpọkụ onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ gaa leta ndị ọkụ gbara n'Osisioma ka o wee chọpụta etu esi ezu mmanụ ụgbọala na steeti ahụ mamee ihe maka ị kwụsị ya. Nke a ga-emedata obi ụmụ Igbo a na-ekwu na anaghị emeta ọfụma."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: