Jacob Zuma: A ga-ekpe aka chịburu South Afịrịka ikpe mpụ

Ebe foto si, Getty Images
Onye chịburu Sawụtụ Afịrịka bụ Jacob Zuma nọ n'elu ogwe maka na a na-ekpe ya ikpe gbasara mpụ na aghụghọ ruru ọnụọgụgụ iri na isii.
Onye ọkaiwu Shaun Abrahams kwupụtara nke a dịka ana-atụ aka na e nwere ike ịta Zuma ezigbo ahụhụ ma ikpe maa ya.
Abraham kwuru na e nwere ọkpụrụkpụ ihe a na-ejide aka eji ekpe ya ikpe ahụ.
Ụfọdụ ebubo ndị ahụ Trump gọnaghịrị gunyere - aghụhgọ, mpụ na ohi.
Zuma bụ onye dị afọ iri asaa na ise hapụrụ ọrụ n'ike n'ọnwa Feburuwarị maka otu pati ANC gwara ya rituo.
Ndị ụlọ omee iwu chọrọ ịchụpụ ya nke ugbo itoolu tupu ọ pụọ.
Ebubo ndị ahụ gunyere ego ijeri dọla 2.5 nke gọọmenti jiri zụta ngwọagha n'afọ 1991 tupu ọ bụrụ onyeisiala.
A na-ekwukwa na Zuma nara aka azụ n'aka ụlọ ndị mba France na-ere ngwọagha jirii ya na-ebi ndụ efulefu. Ndị ọkaikpe ekpegbubuola onye na-adụ Zuma ọdụ gbasara okwu ego maka na ọ chọtara aka azụ ndị ahụ n'afọ 2005 ebe a chụrụ Zuma n'ọrụ dịka osote onyeisiala.
Ugbua, a na-ebo ya otu ebubo aghụghọ, ebubo nrụrụaka abụọ na otu ebubo ohi ego na ebubo iri na abụọ mpụ na aghụghọ.
Shaun Abraham bụ onyeisi ndị ikpe National Prosecuting Authority na bekee kwuru na ụlọikpe bụ ebe kwesiri ka ekpebie ikpe a.
O kwuru na agaghị akwụsị ikpe ndị ahụ dịka Zuma siri chọọ.
Zuma na-agọnarị ebubo ndị a oge niile.










