Kedụ ihe mere Mofe Duncan na nwunye ya ji gbakụta onwe ha azụ?

Ebe foto si, Mofe Duncan/Instagram
Onye ihe nkiri ama ama bụ Mofe Duncan na ya nwunye bụ Jessica Kakkad achịsala ọwa n'ihe gbasara alumdinanwunye ha ka afọ atọ gachara ha jiri lụọ.
Duncan, onye kwupụtara nke a n'igwe okwu Instagram ya ụbọchị Fraide kwuru na o ruola otu afọ ga gbasara kama na ezinaụlọ ha abụọ ka dị na mma.
Ọ gara n'ihu kele ndị na-akwado ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Jessica kelekwara ndị ihe ya na-amasị maka nkwado ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Duncan bụ onye ihe nkiri riterela nzere maka ihe nkiri o merela.
Ihe nkiri Duncan onye Delta steeti merela gụnyere Ovys Voice, Sons of the Caliphate na Three Kings.

Ebe foto si, Misskakkad/Instagram
Jessica Kakkad onye nna ya bụ onye Indịa mana nne ya bụ onye Edo bi na Lọndọn ebe di ya nọ na Naijiria tupu ụgbọ ha akụkasịa.

Ebe foto si, Misskakkad
Ebe ụfọdụ ndị ihe ha na-amasị na-ekpere ha ekpere ọma, ndị ọzọ na-ata ha ụta.
Kepukepu na-ekwu nsogbu dị na etiti ha agbaala afọ mana ha abụọ enweghi onye kpọrọ okwu aha were rụọ n'izu a.









