Pope Francis emeela ihe Pope ọbụla emebeghi mbụ

Onyeisi ndị ụka Katọlịkị n'ụwa niile bụ Pope Francis emela ihe Pope ọbụla embeghi mbụ mgbe ọ gara njem nleta n'ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị Imam nke ụka alakụba.

Njem a so n'ihe ndị o mere iji kwalite mmekọrịta n'eiti ndị ụka Kristi na ndị na-ekpere Allah na mba ahụ dịka onyeisiala ha siri rịọ ya.

Ihe mere na Akwamozu Eze Aguleri

BBC IGBO nọ n'ọgbọ ebe a na-akwa Igwe Aguleri nwụrụ anwụ a na-akpọ Igwe Christopher Nwabụ nwanne Ijigo nke anọ.

Otu omenala dị icheiche nọ n'ọgbọ ne-emepụta ihe iji kwanyere Igwe nwụrụ anwụ ugwu ikpeazụ.

N'egwuregwu,

Otu Watford eriela goolu abụọ n'aka otu Man U dịka ha zutere onwe ha n'asọmpị Premier Lig taa.

Gụọ akụkọ ahụ n'uju ebe a: Chi ndị Man U azọọla ha n'aka ndị Watford

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Ihe onyonyo nke taa

Inec ga-enye pati umengwụ ọsọ

Inec ekwuola na ha ga-ewepụ aha pati ndị agbanyeghị mgbọrọọgwụ n'akwụkwọ ha.

Ha kwukwara na ha ga-enyonye anya n'etu otu pati dị iche iche si mefuo ego n'ọsọ achụmta vootu ha mere ma e kwucha okwu gbasara mmeju ntuliaka 2019.

Onnoghen agbaghaala ikpe ya

Ụlọikpe pụrụ iche a kpọrọ 'Code of Conduct Tribunal' na bekee ajụla ịnapata arịriọ Walter Onnoghen na ya enweghị okwu ọbụla n' akwụkwọ a gbara ya maka akpọpụtaghị akụ o nwere dịka onyeisi ọkaikpe Naijiria.

Ka nke a na-eme Onnoghen ewegala ikpe ahụ n'ụlọikpe mgbegharị dị n'Abuja sị ka ha wezụga mkpebi 'tribunal' na ọ bụ ikpe mkpegbu.

Trump agbachiela agbata ha na mba Mexico?

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ha agbachi agbata ha na mba Mexico ịzụụka na-abịa abịa, dịka o na-ebo gọọmenti mba ahụ ịgba nkịtị ndị mbịarambịara sị ala ha awụjụ mba Amerịka.

Ikpa oke agbụrụ akarịala- Ndị nchịkọta bọọlụ

Ndị na achịkọta egwu bọọlụ na Premier League gụnyere Pep Guardiola na Jurgen Klopp na-eti mkpụ ka elebanye anya n'okwu ịkpa oke agbụrụ nke ha tụrụ arịrị na ọ na-akawanye njọ n'Yurop.