You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ihe ise nwere ike ịnọchi plastik na be gị
Taa bụ ụbọchị ncheta gburugburu obibi nke mba ụwa, nke a kpọrọ 'World Environment Day' na bekee.
Ị ma na ndị uweojii ga-anwụchị gị ma tụba gị na mkpọrọ kpamkpam ma ọ bụrụ na i jiri nailọn(nylon) n'aka na Nairobi,isiobodo Kenya?
Ị makwa na gọọmentị ga-ada gị nha ma ọ bụrụ na i ijiri nailọn bata n'ala Rwanda?
Kedu maka gị onwe gị? I chere na ị ga-anọnwụ otu ụbọchị na-ejighị plastik mee ihe ọbụla?
Ajụjụ ndị a dị ezigbo mkpa n'ihi na plastik na-ebute nnukwu nsogbu na gburugburu obibi na mba ụwa niile.
Plastik na-afachi ọwa mmiri sị aga ma na-ebute nnukwu ọrịa ma ọ bụrụ na ọ ba gị n'ahụ.
Ị ma na chingum (Chewing gum) were rubber n'ime ya, ihe a sokwa n'ihe ejiri eme plastik.
Dọkịnta Ikechukwu Mgbolu gwara BBC Igbo na-agbanyeghị n'ọrịa dị na Naịjirịa abụghị maka plastik banyere n'ime ahụ mmadụ, ọ dị ezigbo mkpa ịkwụsi ike n'ọrịa dịka iba (malaria) na afọ ọsịsa (cholera) ka nkụ na Naịjirịa maka na plastik fachiri ebe mmiri si aga, ma ọ bụ na-emebi mmịrị ndị mmadụ na-aṅụ n'ime obodo dị iche iche.
Cheta kwa ihe na-eme na mpaghara Naija-Delta, bụbụ ebe ọ kachasị njọ bụ nsogbu mmebi gburugburu obibi.
Gịnị bụ ihe ndị ọzọ were ike ịnọchi plastik?
N'ime akụkọ a, anyị ga kọwara gị ihe ndị ọzọ ị nwere ike iji nọchie anya plastik.
- Akwụkwọ (Paper): Akwụkwọ dị mma maka na o nweghị ihe ọjọọ ọ na-eme gburugburu obibi.
- Ihe mere akwụkwọ ji dịkwa mma bụ na ọ baa na mmiri ọ na-agbazee.
- Akwa: Ndị bekee kpọrọ ya 'Wash Cloth'. Akwa nke a bu nke e ji owu( cotton) were mebe.
- Tishu: Ihe a bụ akwụkwọ ọcha eji ehiche ihe ọbụla mana i nwere ike iji ya wee mere ihe ọbụla akpa plastik na-eme.
- Akwụkwọ ndụ: Dọkịnta Mgbolu dọrọ aka na ntị na iji platik na-esi ihe were ike inye nsogbu n'ime ahụ. O kwuru na akwụkwọ ndụ bụ nke kachasị mma.
- Nkata: Nke a bụ ihe ọzọ i nwere ike iji wee nọchie plastik na be gi.
Akụkọ ga-amasị gị: