Twitter Ban in Nigeria: Gọọmenti ewepụla mmachi ha machiri igwe ozi ahụ.

Twitter

Ebe foto si, Twitter

Gọọmentị Naịjirịa ewepụla mmachi ha machiri Twitter ịrụ ọrụ na Naịjirịa kamgbe ọnwa Juun afọ 2021.

Nke a dị n'ozi onyeisi ngalaba a kpọrọ Technical Committee Nigeria-Twitter Engagement and Director-General National Information Technology Development Agency (NITDA) bụ Kashifu Inuwa wepụtara.

Aha onyonyo, Twitter Ban: Twitter bụ ngwa ọrụ Ipob ji agbasakarị ozi ha - Lai Mohammed

Malite na Tọzde ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022, Twitter ga-amalitekwa ịrụ ọrụ na Naịjirịa.

Cheta na gọọmentị machiri Twitter n'ọnwa Juune, afọ 2021 mgbe ụlọọrụ ahụ wepụrụ ozi onyeisiala Buhari dere n'akara ya.

N'ozi ahụ, Buhari ji ya dọrọ aka na ntị na ọ ga-ememina ndị na-achọ itinye ọgbaghara n'ọchịchị ya.

Ozi Buhari na Twitter

Ebe foto si, Twitter

Ụlọọrụ Twitter weturu ozi ahụ ma sị na o megidere iwu na-achị nzirita ozi n'ọgbakọ ha.

Nke a were gọọmentị etiti iwe ha jiri machie Twitter ma sị na ha na-akpa agwa a na-enyo enyo.

Ha gaara n'ihu kwuo na Twitter anaghị ewepu ozi ịkpọasị nke ha sị na Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob kwuru kama ha wepuru nke Onyeisiala Buhari.

Boris Johnson ga-arịda n'oche maka ịgba oringo mebiri iwu Covid-19

Boris Johnson

Ebe foto si, European Pressphoto Agency

Nkọwa foto, Mgbe ndị omeiwu na-agba Boris Johnson bụ onyeisiọrụ mba UK ajụjụ ọnụ ụbọchị Wenezde 2022

Akpọọla oku ka Onyeisi gọọmentị mba Uk bụ Boris Johnson jiri aka ya gbaa arụkwaghịm maka imebi iwu Covid-19 o so tinye.

Johnson rịọrọ ndị omeiwu mba ahụ biko maka ịgba oringo mgbe ha nọ ọnọdụ onye apụla ezi n'afọ 2020.

Ndị otu pati Tory, ọkachasị Douglas Ross na William Wragg sị na Johnson ga-aritu n'oche maka ịmebi iwu ha, agbanyeghị na ndị ọzọ dịka Dominic Raab dọnyeere Johnson ukwu.

Omeiwu Ross sị na ya na Johnson "kpara nkata miri eme" ka ọ rịọchara ya bụ mgbaghara ụbọchị Wenezde.

Ọ sị na ya ga-edepụrụ kọọmitii 1922 akwụkwọ igosi ha iwe ya na enweghị ntụkwasiobi ebe Johnson nọ.

Ọ sị, "ọ bụ onyeisi gọọmentị a bụrụkwa onye so tie iwu a, e kwesiri ịta ya ahụhụ maka imebi iwu a".

Ọ bụrụ na ndị omeiwu mmadụ 54 depụrụ kọọmitii 1922 akwụkwọ, ọ nwereike ịme ka etinyere Johnson anya n'ụdị nwereike ịkpapụ ya n'ọchịchị.

Ndị Minista mba ahụ arịọla ka ahapụ ya bụ okwu rụrọ mgbe nchọpụta nke Sue Gray na-eme maka ya ga-apụta ihe.

Mana William Wragg bụ onyeisi kọọmitii ọzọ nwere agba sị na nke ahụ ekwesighị ịme dịka ọ gwara BBC Radio 4.

Ụlọikpe n'Amerika akpọọla egwo nkụ n'inyoba anya n'ebubo eboro Prince Andrew

Prince Andrew, Virginia Roberts

Ebe foto si, Virginia Roberts

Nkọwa foto, Prince Andrew, Virginia Roberts (bụzị Giuffre ugbua) na Ghislaine Maxwell na 2001

Ụlọikpe n'Amerịka akụchapụla akwụkwọ Nwaeze nwaanyị ndị Briten bụ Prince Andrew gbara iji kụchapụ ebubo eboro ya maka ịwakpọ nwagbọghọ dị afọ iri na asaa.

Virginia Giuffre e rubeghị afọ iri na asaa mgbe ihe mere e ji bo Andrew ebubo ịdịna ya n'ike mere.

Prince Andrew agọọla ụkwụ na aka ya na o emeghi ihe dị etu ahụ.

Virginia Giuffre wepụrụ Andrew n'ụlọikpe n'afọ 2001 maka ebubo a.

Ndị ọkaiwu Andrew rịrịọ ka ọkaikpe Lewis A. Kaplan nke Ndịda New York ka ọ kachapụ ebubo dịka e si kụpụ nke Jeffrey Epstein na 2009 mana ọkaikpe ahụ jụrụ ajụ.

Nke a pụtara na a ga-ekpe ya bụ ikpe ọzọ n'afọ a.

Buckingham Palace ekwehji ekwu ihe ọbụla banyere okwu a.

Ọkaikpe Kaplan kwusikwara ike na mkpebi a egosighị na Giuffre kwuru eziokwu maọbụ na ọ tụrụ asị.

Mana Giuffre sị na "obi dị m ụtọ maka ya bụ mkpebi ahụ".