Onye ọkammụta na Russia kwenyere na ya gburu mmadụ ka a hụrụ aka nwaanyị n'ime akpa ya

Ebe foto si, EPA
Otu onye ọkammụta a ma ama na mba Rọshịa ekwenyela na o gburu ọchụ.
Nwoke a bụ Oleg Sokolov dị afọ 63 gburu enyi ya nwaanyị, onye bụbụ nwata akwụkwọ ya.
Ọ bụ n'ime mmiri ka a hụrụ Maazị Sokolov ka o bu akpa ebe aka nwaanyị egbubiri egbubi dị n'ime ya.
Dịka akụkọ siri kwuo, manya na-egbu Sokolov mgbe a hụrụ ya ka ọ na-achọ itufu akpa ozu mmadu dị n'ime ya.
Ndị uweojii mechara hụụ ozu Anastasia Yeshchenko dị afọ 24 n'ụlọ Sokolov, ebe gburichara ya egburi.
Ọkammụta Sokolov bụ onye e ji amamihe banyere onye chịbụru mba Frans mgbe gboo bụ Napoleon mara.
Mba Frans enyela Ọkammụta Sokolov nturugo ha a kpọrọ 'Légion d'Honneur'.
Ọkaiwu ya gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na o kwenyere na o ikpe mara ya, ma na-aza ajụjụ dị n'ime ya.
Akụkọ na-ekwu na nwoke a gburu enyi ya nwaanyị ka ha na-arụrịtaụka ma were mma nwere eze a kpọrọ 'Saw" kwọpụ ya isi, aka nakwa ụkwụ.
Ọ sị na ọ chọrọ iji nwaayọọ tufucha anụ ahụ nwaagbọghọ ahu yupu o gbuo onwe ya.









