You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụmụaka 12 na onye nchịkọta ha apụtala n'ọgba Thailand
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụmụaka iri na abụọ nakwa onye nchịkọta ha apụtala nime ọgba ahụ na mba Thailand.
Ndị ọrụ Navy Seal du ọrụ mgbapụta a, kwuru na a kpọpụtachaala ụmụaka 12 a na onye nchịkọta ha tọrọ n'ime ọgba kemgbe izu abụọ.
N'ihe ha dere na Facebook, ha kwuru sị "ụmụaka 12 a e ji 'wild boars' mara na onye nchịkọta ha apụtala n'ime ọgba. Ahụ zuru onye ọbụla oke. Hooyah."
A kpọpụtara ụmụaka asatọ ụnyaahụ, ma kpọpụta ụmụaka anọ, onye nchịkọta ha na otu dọkịta gara inyere ha aka taa.
Cheta na ụmụaka a na onye nchịkọta ha tọrọ n'ime ọgba ụbọchị Juun 23.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekeleela ndị nyere aka ịkpọpụta ụmụaka a.
Ndị otu Manchester United kwuru sị na ha chọrọ ka ụmụaka a na onye nchịkọta ha bịa n'ọgbọ egwuregwu ha ma ha gbakee.