You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akpokpụtala ụmụaka anọ n'ọgba Thailand
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na akpọputala ụmụaka anọ n'ime ọgba Thailand bụ ndị nọ ebe ahụ kamgbe izuụka abụọ gara aga.
Onye nta akụkọ nke bi na Bangkok aha ya bụ Florian Witulski bụ onye na enwetere anyị akụkọ ụmụaka a na ka esi azọpụta ha n'otu na n'otu.
Ugbua dọkinta nwaamadi mba Ọstralịa bụ onye nọ n'ime ọgba ahụ ebe ụmụaka ahụ na onye nkụzi ha nọ bụ ụzọ kpọpụta ụmụaka abụọ ahụ esicheghị ike.
Ka ọdị ugbua, otu natakụkọ Reuters kwuru na akpọpụtala isii n'ime ụmụaka iri na abụọ ndị ahụ ndị ka ọnyeisi ndị ọrụ ahụike jị ọrụ ahụ gwara ha.
Ọbaozi soshal midịa na ekpo ọkụ n'ọjịjị a na-aja ndị nọ na ọrụ ịzọpụta ụmụaka ahụ.
Lekwa sụpirisụpiri ya na bekee eba
Ndị ọrụ anyị na BBC Vietnamese zitere ihe onyonyo nke gosiri ka ụgbọelụ Helikọpta mbụ si bute ụmụaka ahụ akpọpụtara n'ime ọgba ahụ n'ụlọọgwụ.
Ambulansi n'onwe ya erukwala ụlọọgwụ nke Chiang Rai nke dị nso ebe ọgba ahụ dị
Onyeisi mba Amerika bụ Donald Trump ekwola na mba US na-akwado mba Taịland n'ọrụ ịzọpụta ụmụaka ahụ tọrọ atọ n'ime ọgba ịzụụka abụọ gara aga.
Kedụ ihe ịze ndụ dị na-ịzọpụta ụmụaka a?
Azọpụtara nwata nke bụ ngwangwa karịa ka atụrụ anya, nke na-arụtụaka na ya bụ ọrụ ataghị akpụ ka atụrụ anya.
Ọ bụ idere mmiri ribidoro ụmụaka ahụ n'ime ọgba ahụ.
A na-atụ ekwu na oke mmiri nwere ike izo ọzọ nke ga-eme ka idere mmiri ahụ mụbanwanye.
Ka ọ dị ugbua o doghi anya mmadụ ole akpọpụtalara maka ụfọdụ na-ekwu isii mana onyeisi ọrụ ndị na-akpọpụta ụmụaka ahụ bụ Narongsak Osottanakorn kwara ndị nta akụkọ na ọ bụ mmadụ anọ ahụ zuru oke pụtalara.
Onyendu ọrụ bụ Osottanakorn kwuru na ọ bụ mmadụ 90 aka siri ike na-igwu mmiri so n'ọrụ nzọpụta a.
Iri ise n'ime ha bụ ndị Taịland ebe iri anọ ndi ọzọ sị ofesi.
Akpọpụtara onye mbụ mgbe ọkụrụ elekere iri ụtụtụ a.
Ụmụaka anọ ndị ahụ nọ n'ụlọọgwụ ụgbụa na-anata ọgwụgwọ.
Ọrụ a ga-amalite ọzọ n'ụtụtụ Mọnde.
Nke a bụ onye agha ụgbọmmiri nke nwụrụ ebe ọ gara ịzọpụta ụmụaka ahụ.
Akara twitter a na-akpọkụ oha na eze ka erubere ya bụ nwaamadị isi ncheta nke ọnwu.
A na-etinye ihe ọhụrụ n'akụkọ a mere ugbua mana a ga-egosipụta ya n'uju n'oge nadighị anya. Biko mepegharịa ihuakụkọ a maka akụkọa n'ụjụ ya.