Ndị Kọrịa sị na iwu jizi iri anụ nkịta

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ụlọikpe dị na Saụt Koria enyela iwu imachi ndị mmadụ igbu ma rie anụ nkịta.
Ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụ anụmanụ kwuru na iwu a ụlọikpe tinyere ga-emepe ohere ndị mmadụ ga-eji na-ata anụ n'ụzọ na-ezighị ezi.
O teela ndị Saụt Koria ji bido ịta anụ nkịta, nke mere ha na-eji eri ihe ruru nkịta nde kwa afọ.
Mana ugbua, ọtụtụ n'ime ha ebidola ịghọta na nkịta bụ ezigbo enyi mmadụ, mere ka ha wetuo aka n'etu ha si eri anụ nkịta.
N'afọ gara aga, ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụ anụmanụ tinyere akwụkwọ maka otu onye na-azụ nkịta n'ime Bucheon, onye ha kwuru na "ọ na-egbu ụmụanụmanụ etu ọ masịrị ya" ma na-ada iwu gbasara ịdị ọcha.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-agba akwụkwọ mechara gbaa onye ahụ na-azụ nkịta akwụkwọ, ndị ụlọ ikpe Bucheon City mara ya iwu ma gwa ya kwụọ $2,700.
Ọkaiwu Kim Kyung-eun gwara ndị ntakụkọ AFP na ihe ikpe ndị ụlọikpe nyere masịrị ya.
"Ọ dị mkpa makana ọ bụ iwu mbụ ụlọikpe na-enye na-ekwu na igbu nkịta maka anụ ya bụ ihe megidere iwu.
"Ikpe a emepeela ụzọ maka ịmachi iri anụ nkịta chaachaa."

Ebe foto si, Getty Images
Otu onye na0-anọchite ndị na-azụ nkịta bụ Cho Hwan-ro kwuru sị ka gọọmentị mee ka iri anụ nkịta ghara ịbụ ihe e ji ada iwu. O kwukwara na ha ga-amanye gọọmentị ọgụ ruo na ngwụcha ma ọ bụrụ na ha emeghị nke a.
Cho kwuru sị ka e kewaa ha n'ime "nkịta a na-azụ maka oriri na nke e ji eme enyi" maka na ebumnobi ha ji azụ nkịta ndị a dị iche, nke pụtara na nri e ji azụ ha dị iche ebe nkịta ndị a dịkwa iche iche.
"Ndị mmadụ na-azụ ehi, ezi, ọkụkọ na ọbọgwụ, kedụ nke nkịta ji pụọ iche?"
Ndị na-azụ nkịta na-eji ebe ha bi mere ebe ha na-egbu nkịta, maka na gọọmentị enyeghị ndị na-egbu anụ akwụkwọ ikike igbu nkịta.
Anụ nkịta na Naịjirịa
Abịa na Naịjirịa, enwere ndị na-ata anụ nkịta, mere na e nwere ahịa a na-akpọ Dawaki dị na Plateau steeti bụ ebe a na-ere anụ nkịta.
Ụfọdụ ndị na-ego ya ma ree ya n'ụlọ oriri ha, ebe ndị mmadụ na-ego ya ma jiri mmanya ọkụ butuo ya.
A na-erekwa anụ nkịta n'ahịa Ushafa dị na Bwari n'Abuja, ebe ndị ọkwa ha gbagotere na-abịakwa agba ha aka ahịa.

Ebe foto si, Getty Images










