Ikpe amaala Bill Cosby n'ebubo mwakpo nwaanyị

Bill Cosby

Ụlọikpe n'Amerika ekpebiela na ikpe mara onye ọkpaọchị bụ Bill Cosby n'ebubo atọ eboro ya dika onye na-awakpo ụmụnwanyị n'ike.

Ọ bụ Andrea Constand bụbu onye egwuregwu basketbọọlụ na-ekpe Cosby n'ụlọikpe ka mgbe afọ 2004.

Cosby dị afọ 80, ka na-agọ ebubo a, mana mkpebia nwere ike ị tinye ya na mkpọrọ ruo afọ iri atọ.

Nke a bụ ugboro abụọ Cosby na-azọ isi ya n'ulọikpe maka ebụbọ mwakpo ụmụnwaanyị.

Bill Cosby bụ onye ama ama na ihe onyonyo akpọrọ 'The Cosby Show' na bekee.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka na-ebo Cosby ebubo mwakpo n'ike mana Cosby kwuru na ha niile bụ asị.

Akụkọ ga-amasị gị: