You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee nri di iche iche esi n'akpụ emepụta
Akpụ bụ nrị a na-erikarị na mpaghara Afirika, Asia na Saụtụ Amerika makana ọ dị ebe niile dị kwa ọnụala na ebe ndị a.
Akpụ na-enye ahụ ikikere na-emekwa ka ahụ kpuo ọkụ etu o kwesiriekwesi.
E nwereike ị bacha ya, sie ya, ghe ya eghe, gbakpọ ya maọbụ baa ya na mmiri.
E nwere akpụ na-atọ ụtọ ma nwee kwa nke na-elu inu.
Akpụ tọrọ ụtọ nwere Kemikal sinaid na-erughị 50mg n'otu kilogram mana akpụ na-elu ilu nwere sinaid ruru 400mg n'otu kilogram.
Lee nri ụzọ ole na ọle eji akpụ emepụta:
A na-eji akpụ eme Abacha:
Akpụ asụrụ asụ:
A na-eji ya emeputa achịcha
Akpụ mmiri
A na-eji akpụ emeputa Gari
Supageti
Eji akpụ ese nrị
A na-akwọ akpụ were ya mee ọtụtụ ihe
Ihe ndị ọzọ ị na-amaghị maka akpụ:
- Eji Akwụkwọ akpu esi nri
- Akwụkwọ akpụ nwre protin karịa mgbọrọgwụ ya
- Tupu erie akwụkwọ ya a ga-esiriri ya n'ọkụ ma wufuo mmiri ya
- Akpụ dị mma n'ahụ onye na-achọghị gluten
- Akpụ na-achụpụ ibu makana ọ na-eme ka agụrụ ghara igụ mmadụ.
- A na-eji akpu akwọrọ akwọ eme ka anụ ahụ na-akwọ murumuru
- A na-eji mgborogwu akpụ eme ka ụburu rụọ ọrụ ọfụma
- A naghị eri akpụ maọbụrụ na-esighị ya n'ọkụ nke ọma.
Nri eji akpụ emepụta karịrị akarị. BBC Igbo ga-achọ ka ị setere ihe onyonyo nri ndị eji akpụ eme na obodo ụnụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: