Ogunseye: 'Akụkọ anyị ga-emetụ gị ebe ọbụla ị nọ'

Aha onyonyo, Ogunseye: 'Akụkọ anyị ga-emetụ gị ebe ọbụla ị nọ'

Onyeisi Ọdịda Anyanwụ mba Afrịka nke ntaakụkọ BBC bụ Toyosi Ogunseye ekwuola na akụkọ BBC n'asụsụ Pidgin, Yoruba na Igbo ebutela ihe dị iche n'ụzọ esi agbasa akụkọ n'ala Naịjirịa na Afrika.

Ogunseye kwuru na ụlọọrụ BBC bụ ụlọọrụ nke mbụ ga-agbasa akụkọ n'asụsụ a na Naịjirịa.

N'okwu ọnụ ya: "ma ọ bụrụ na ịnaghị asụ bekee, ma ọ bụrụ na pidgin ma ọ bụ Igbo ma ọ bụ yoruba ka ị n'asụ, akụkọ anyị ga-erutegi aka. Nke a mere ka akụkọ anyị n'asụsụ ọhụrụ a ji dị ezigbo mkpa."

Ihe ọhụrụ a BBC mụpụtara dịkwa ndị na-asụ asụsụ Frenchị mkpa makana ha ga-anụ akụkọ pụrụịche, nke anụbeghị n'oge garaaga.

Ogunseye kwuru: "ebe ọbụla n'ala ndị n'asụ asụsụ Frenchị ị nọrọ, akụkọ BBC ga-erute gị na'ebe ahụ."

Mmeme a anyị na-eme echi bụ maka ị kele ndị enyi anyị niile n'ime ọrụa maka ihe ọma niile ha mere na-afọ iri isi na otu garaaga.