Buhari ekelela Xi Jinping maka e megharịrị ya onyeisiala China

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye nkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Femi Adesina dere akwụkwọ ozi degara onyeisiala mba China bụ Xi Jingping taa maka na e megharịrị ya onyeisiala mba ahụ.

Adesina kwuru na Buhari jiri aka binye aka n'akwụkwọ ozi ekele ahụ o zigara Xi.

O kwuru na Buhari toro onyeisiala mba China maka amamihe na ụdị ọdịnaihu o nwere maka China.

Ụlọọrụ onyeisiala Buhari depụtakwara ozi ekele ahụ n'igwe mgbasa ozi Twitter taa.

N'akwụkwọ ozi ekele Buhari dere, o kwupụtara olileanya ya na Naịjiria na China ga-aga n'ihu na-enwe ezi mmekọrịta.

Cheta na otu pati Communist nke Xi nọ na ya gbanwere iwu China iji mee Xi onyeisiala mba ahụ rue n'ọnwụ.

Kemgbe 1990, iwu China kwuru na ọ bụ naanị ugbo abụọ ka onyeisiala China ga-anọ n'ọkwa.

Mana Xi, bụ onye kwesiburu ịrịtụ n'afọ 2023, akpọpụtala onye ga-anọchị ya mgbe pati na-achị China nwere nnọkọ a n'ọnwa Ọktoba 2017.

Iwu a emegharịrị ga-enye Xi Jinping ohere ịnọdu ka onyeisiala karịa ugboro abụọ o kwesịrị ịnọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: