You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Olympic Games Tokyo 2020: Ka o si aga n'egwuregwu Olympics 2020
A malitela emume mmepe asọmpi Olympics 2020 nke na-eme na Tokyo dị na mba Japan taa bụ Fraide abalị 23 nke ọnwa Julai afọ 2021.
Ọtụtụ mba ruru iri ise na otu bịara ya bụ asọmpi ji ọkọlọtọ ha dị iche iche na-efe dịka ha na-egosi ụwa onwe ha.
Mba ndị dịka Greece bụ ndị bu ụzọ gosi onwe ha site n'ife ọkọlọtọ ha ebe mba Japan bụ ndị na-ahazi ga-abụ ndị ikpeazụ.
Mba Jamini nọkwa n'egwu
Mba Itali pụtakwara n'egwu igosi ụwa ihe ha jiri biri.
Mba Briten gosikwara na ha abụghị ndị ikpeazụ n'okwu banyere asọmpi Olympic
Ihe I kwesịrị ịma maka egwuregwu Olympics Tokyo 2020
Kamgbe a malitere egwuregwu a kpọrọ Olimpik n'afọ 1896 na mba Greece, onwebeghị nke dịka nke Tokyo 2020.
Otu okpụrụkpụ ihe kpatara nke a bụ n'ihi ọrịa ọjọọ coronavirus maọbụ covid19.
Taa bụ Fraịde, abalị 23 nke ọnwa Julaị 2021, ka asọmpi nke afọ a na-amalite n'uju.
Ndị Afrịka a bụ ndị ejiri nọchite anya mpaghara dị iche iche n'Afrịka. A họpụtara ha dịka etu asọmpị Olympik sirimetụta ha ya na ntụruugo ole ha nwetarala ma etu egwuregwu ha na-eme siri pụo iche.
Lee ihe gbara ọkpụrụkpụ i kwesịrị ịma maka ya
- A ga-akpọ ya Tokyo 2020, n'agbanyeghị na a na-eme ya n'afọ 2021 (cheta na egwuregwu a kwesịburu ịdị n'afọ 2020 mana mfesa covid19 mere e ji yigharịa ya)
- Agaghị anabata ndị mmadụ ịbịa kirie egwuregwu na asọmpi dị icheiche a ga-enwe
- Asọmpi bọọlụ nke ụmụnwaanyị na nke ụmụnwoke amalitelarị abalị abụọ gara aga
- Ọ bụghị iwu na ndị ga-eso n'asọmpi a ga-agbarịrị ọgwụ mgbochi covid19, mana ndị nhazi ya bụ egwuregwu na-arịọ ka onye ọbụla gbaa ya
- Iyi akwa mkpuchi ihu ga-abụ iwu oge ọbụla, naanị oge ha agaghị eyi ya bụ oge ha na-asọ mpi
- Iji gbochie mmekọrịta ahụ mmadụ na ibe ya, onye ọbụla na-asọ mpi ga-abata n'ogige olimpik abalị ise tupu ụbọchị ọ ga-eme egwuregwu nke ya, ma laa abalị abụọ o mechara egwuregwu ya.
- Ndị mmadụ ga-eji aka ha nyanye onwe ha ọla ntuurugo ha ritere, ọ bụghị mmadụ ga-anyanye ha ya
- E nwere ọtụtụ asọmpi a ga-amalite ime nke mbụ na olimpik nke afọ a. Ha gụnyere: 'baseball/softball', 'skateboarding', 'surfing', 'sport climbing' na 'ịgba karate'
- Onye kacha bụrụ okeneye n'Olimpik nke afọ a bụ Mary Hanna onye mba Ọstrelia, ọ gbara afọ iri isii na isii (66), ọ na-anya 'Horse' n'asọmpi a kpọrọ 'dressage'
- N'aka nke ọzọ, onye kacha bụrụ nwata bụ nwaada Hend Zaza onye Sirịa, ọ dị afọ iri na abụọ (12). Ọ na-apịa tebulu tennis.
Ndị Naịjirịa ga-eso n'asọmpi Olimpik 2020
Naịjirịa mmadụ iri isii (60) ga-anọchi anya Naịjirịa n'asọmpi 'Olympics' nke afọ a.
Asọmpi ha ga-esonye na ya gụnyere: 'Basketball' (ụmụnwoke na ụmụnwaanyị, 'Artistic Gymnastic', na 'Athletics' (Ọsọ, ịwụli elu, ịtụ ihe ọtụtụ).
Ndị ọzọ bụ: 'badminton', mgba, mgba takwando, ịkpa ụgbọ, ọsọ ụgbọ mmiri (canoe sprint), igwu mmiri, na tebulu tennis.
Onye bụ onye ndu (captain) otu Naịjirịa n'Olimpik afọ a bụ Aruna Quadri na-apịa tebulu tenis.
Nke a bụ 'Olimpik' nke atọ Aruna Quadri na-agara Naịjirịa
Ndị otu basketball Naịjirịa enwetaghị akwa ha ga-eyi n'asọmpi a n'oge, dịka ndị 'custom' jichiri ya ogologo oge dịka e si mba Chaịna tụlata ya.
Ọ bụ ndị a na-akụ basketball ji aka ha zụtara onwe ha akwa dịka ha na-eme nkwado ha.
A na-akwụ mmadụ ụgwọ maka i turu ugo n'asọmpi Olimpik?
E nweghị ego ndị na-ahazi egwuregwu Olimpik na-akwụ onye ritere ọla ọcha, ọla edo maọbụ ọla nchara.
Mana mba dị icheiche mapụtara ego ha na-akwụ, maọbụ ihe ndị ọzọ ha na-emere ndị tuteere ha ugo na ya bụ asọmpi.
Iji maa atụ, mba Amerịka na-akwụ $37,500 maka ọla edo, $22,500 maka ọla ọcha, na $15,000 maka ọla nchara.
Mba dịka Singapore na-akwụ ndị be ha otu nde dọla maka ọla ọcha, ebe mba Indonesia na-enye ndị nke ha $750,000 maka ọla edo.
Odochabeghị anya ego ole gọọmentị Naịjirịa ga-eji tie onye ritere ọla ọbụla n'Olimpik nke afọ a aka n'obi.
Mana n'egwuregwu nke mba Afrịka (African Games) e mere na Morocco na 2019, gọọmentị Naịjirịa nyere ndị tuuru ugo $3000, $2000 na $1000 maka ọla edo, ọla ọcha na ọla nchara n'otu n'otu
Mike Brown - Onye nkuzi 'basketball' Naịjirịa
Otu onye kwesịrị ka a kwanyere ya ugwu n'ụzọ pụrụ iche n'Olimpik nke afọ a bụ Mike Brown.
Otu 'basketball' Naịjirịa na-emezi nnọọ nke ọma ugbua n'ihi nwa amadi a bụ onye nkuzi ha.
Mike Brown anaghị eri ụgwọ ọnwa ọbụla dịka ọ na-akuziri ndị Naịjirịa ugbua, kama o kwuru ka e were ụgwọ ọnwa ya na-akwalite egwuregwu 'basketball' na Naịjirịa.
Ọ bụkwa ya mere ọtụtụ ụmụ Naịjirịa a mụrụ na mba ofesi jiri kweta ịkụrụ Naịjirịa bọọlụ.
Ihe i kwesịrị ịma maka Mike Brown
- Ọ bụ onye mba Amerịka, a mụrụ ya na Ohio.
- Ọ kụrụ 'basketball' mana ọ kụtaghị ọnụ ya, nke mere o jiri banye nkuzi
- Ọ rụọla ọrụ dịka onye nkuzi nakwa osote onye nkuzi otu dị icheiche a ma ama n'Amerịka
- Ọ kụziiri ndị dịka Kobe Bryant, LeBron James, Steph Curry na ndị ọzọ
- Nkwekọrịta ya na Naịjirịa bụ naanị maka asọmpik Olympic. Asọmpi a gwụchaa, ha ga-enwe nkwekọrịta ọzọ
- Gọọmentị Naịjirịa enyeghị Mike Brown na ndị otu ya nkwado n'oge, nke a mere ka ọ malite atụmatụ ịchụ nta ego site n'ịntaneetị, nke a kpọrọ 'Go-fund-me' na bekee
Usoro
Ndị Afrịka a bụ ndị ejiri nọchite anya mpaghara dị iche iche n'Afrịka. Ahọpụtara ha dịka etu asọmpị Olympik sirimetụta ha ya na ntụruugo ole ha nwetarala ma etu egwuregwu ha na-eme siri pụo iche.
NDI MERE YA:
Editorial production by Nkechi Ogbonna, Princess Abumere and Muthoni Muchiri. Design by Olaniyi Adebimpe and Millicent Wachira. Web Developer: Purity Birir. Additional support by: Sally Morales and Celestine Karoney.
FOTO:
Getty Images, The International Basketball Federation, AFP, Nigerian News, Nigerian Rowing Canoeing and Sailing Federation, Nigerianews, Mekseb Debesay, Sailing Club of Mozambique, Giana Farouk, EPA, Press Focus/News Pix via PA, Erwythereyet via Twitter, Bruce Viaene via Olympics, ClimbZA, DW via Club of Mozambique.