You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chelsea vs Man City: A gwọọla Chelsea ka nkwọbi e ji tụọrọ afọ ọhụrụ aja
Manchester City ji ọkpụ goolu atọ chara acha asatara otu tie Chelsea ihe n'ihu nne ha na Stamford Bridge dịka agụụ si eti nwata.
Man City malitere ịpịa Chelsea ụtalị mmọnwụ a na nkeji 18' mgbe Ilkay Gundogan nyere goolu mbụ ha.
Ka asọmpi a na-aga n'ihu, Chelsea chere na Man City bịara ịchị ọchị mana e nyere ha goolu nke abụọ na nkeji 21' site n'aka Phil Foden.
Mgbe chi nọzi bọọ Chelsea n'anya bụ mgbe Kevin De Bruyne mezuru ya goolu atọ na nkeji 34'
Chelsea malitere na-esi ọnwụ ka nwa mkpị a chọrọ iji agwọ nkwọbị mana Man City kwechiri.
Mana dịka ọ fọrọ tịkọm tịkọm ka e gbuchie bọọlụ, Chelsea siri ọnwụ nyete otu goolu site n'aka Callum Hudson-Odoi.
Ugbua Chelsea nọ n'ogogo asatọ na ebe Manchester City nọzi n'ogogo ise nke tebụlụ Premier League.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmeri a
As a Boss sị na a na-asụ Chelsea ka akpụ
Illy One sị na lee ka ọnọdụ Stamford Bridge dị ugbua.