Barcelona na Bayern Munich: Bayern Munich adọkaala ọbante ndị Barcelona n'ime ahịa

Ebe foto si, Getty Images
Bayern Munich ataala Barcelona ahụhụ mmehie ha n'asọmpi Champions League nke ha gbara n'abalị Fraịde.
Goolu ise chara acha ka Bayern Munich nyerela n'asọmpi a n'agbanyeghị na ọbụ agba nke mbụ ka a gbarala.
Mana otu n'ime goolu ahụ Bayern nyere bụ n'ime goolu nke ha, dịka David Alaba nyere onwe ya goolu.
Muller nyere goolu abụọ, Gnabry enye otu ebe Perisic nyere nke ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
Oge agba nke abụọ malitere, Lewandoski nyekwara otu goolu mana a kachapụrụ ya n'ihi na ọ nọ 'offside'.
Luiz Suarez mechara nyetere Barecelona otu goolu, mana Kimmich nyekwara goolu ọzọ iji mee ya 5-2.
Lewandoski mechara nyete goolu nke ya, ebe Coutinho batara nye goolu abụọ.
Cheta na Coutinho gbaburu bọọlụ na Barcelona tupu ọ pụọ.
Nke a pụtara na ọ bụ ọkpụ asatọ a satara naanị abụọ ka Bayern ji merie Barecelona iji ruo agba nke ikpeazụ nke Champions League afọ 2020.










