Ihe Ipob kwuru maka ebubo Asari Dokubo na Nnamdi Kanu chọrọ ime Biafra 'Jewish state'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Otu Ipob ekwuola na o nweghị eziokwu dị n'ebubo a na-ebo na onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu chọrọ Biafra e nwere naanị okpukperechi ndị Juu bụ Judaism.

Nke a bụ n'ọsịsa ebubo Asari Dokubo boro n'ihe onyonyo o wepụtara ọhụrụ na-efegharị na soshal midia ebe o kwuru na o nwere ndị kwuru na ha ga-egbu ndị otu Kraist na ndị niile ekwenyeghị na naanị okpukperechi ndị Juu.

Dokubo, onye kwuru na ya bụkwazị onye Biafra kwuru na Biafra nke ya kwenyere na ya bụ ala onye ọbụla ga-enwe ohere ikpere Chukwu n'ụzọ o si masị ya.

"Anyị niile bụ ndị Biafra, ụfọdụ ndị Biafra kpebie na ha nwere ikike ọnwụ na ndụ, ha kwuo na ha ga-egbu ndị nke Kraist niile, mechie ụlọụka".

"Ha amalitela na-akutu akpụlakpụ Mary, Angel Gabriel na ihe ndị ọzọ, sị na Biafra anyị bụ nke nwere okpukpere ndị Juu."

Nke a bụ ọsịsa Dokubo gbasara nkatọ Nnamdị Kanu katọrọ ndị ụkọchukwu sị na ha niile 'dị ọjọọ' n'ihe onyonyo o wepụtara na nso nso a.

Mana Kanu site n'ọnụ ọkaiwu ya pụrụ iche bụ Aloy Ejimakor kwuru na ebubo ahụ bụ ebubo ụgha.

"Asari Dokubo na-atụ asị ọcha megide Nnamdi Kanu".

"Nnamdi Kanu enwebeghị oge o kwuru na Biafra ga-abụ ebe a na-ekpe naanị ụka ndị Juu."

Ejimakor kwuru na ọtụtụ ndị ezinaụlọ ya bụ ndị otu Kraisti, dịka Kanu na onwe ya bụbu onye otu Kraistị chegharịrị kpewe ụka Juu.

Ọ siri na ọ bụ Kanu na-ede akwụkwọ mkpesa maka mkpagbu a na-akpagbu ndị otu Kraist ga-na ekwu ụdị ọkwu.

O gara n'ihu kwuo na "O bụrụ na ọ na-ekwu na ọtụtụ ndị Ipob bụ ndị ụka Juu maọbụ na ha si n'ụka Kraist banye ụka ndị Juu, na ọ bụghị asị".

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: