Fury vs Wilder II: Tyson na Deontay ekwetela izute onwe ha ọzọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị otiọkpọ abụọ a ma ama bụ Tyson Fury na Deontay Wilder ekwetala izute onwe ha ọzọ.

Ọgụ a ga abụ n'obodo Las Vegas nke mba Amerịka ka ọ ga-adị mee, n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020.

Ọ bụ ọgụ nke a ka a ga-eji amata mbe abụọ nke bụ oke.

Cheta na Fury na Wilder zuteburu onwe ha n'ọnwa Disemba nke 2018.

N'ọgụ nke ahụ, ha abụọ enweghị onye meriri ibe ya.

Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya ka a lụgharịa ya bụ ọgụ.

N'akara 'Twitter' ya, Wilder kwuru na "oge eruola mgbe m ga-emetọpụ ihe m malitere".

"A ga m agba mbọ hụ na m zara ajụjụ niile."

Wilder nwere ike itufu mgbanukwu WBC ya ma ọ bụrụ na Fury merie ya na Febrụwarị 22.

Fury n'onwe ya gwakwara ndị nkwado ya na ya "ga-akutu Wilder, kụpụ ya mkpụrụ ọkwụrụ n'anya".

Mgbe Fury na Wilder zutere n'afọ gara aga, Wilder kuturu ya n'ala ugboro abụọ mana o bilitere.

N'ọnwa June, Fury meriri Tom Schwartz nke mba Jamanị, ma merie Otto Wallin nke mba Sweden n'ọnwa Septemba.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: