You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Fury vs Wilder II: Tyson na Deontay ekwetela izute onwe ha ọzọ
Ndị otiọkpọ abụọ a ma ama bụ Tyson Fury na Deontay Wilder ekwetala izute onwe ha ọzọ.
Ọgụ a ga abụ n'obodo Las Vegas nke mba Amerịka ka ọ ga-adị mee, n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020.
Ọ bụ ọgụ nke a ka a ga-eji amata mbe abụọ nke bụ oke.
Cheta na Fury na Wilder zuteburu onwe ha n'ọnwa Disemba nke 2018.
N'ọgụ nke ahụ, ha abụọ enweghị onye meriri ibe ya.
Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya ka a lụgharịa ya bụ ọgụ.
N'akara 'Twitter' ya, Wilder kwuru na "oge eruola mgbe m ga-emetọpụ ihe m malitere".
"A ga m agba mbọ hụ na m zara ajụjụ niile."
Wilder nwere ike itufu mgbanukwu WBC ya ma ọ bụrụ na Fury merie ya na Febrụwarị 22.
Fury n'onwe ya gwakwara ndị nkwado ya na ya "ga-akutu Wilder, kụpụ ya mkpụrụ ọkwụrụ n'anya".
Mgbe Fury na Wilder zutere n'afọ gara aga, Wilder kuturu ya n'ala ugboro abụọ mana o bilitere.
N'ọnwa June, Fury meriri Tom Schwartz nke mba Jamanị, ma merie Otto Wallin nke mba Sweden n'ọnwa Septemba.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: