Manchester City vs Manchester United: Man Utd bụ Eze ama n'obodo Manchester

Ndị Manchester United egosila na agadị nwaanyị anaghị aka nka na-egwu ọ ma agba dịka ha ji okpu goolu abụo astara otu were merie ndị Manchester City.

Nke a bụ mmeri nke mbu ndị otu Manchester United na-enweta na abụghị na 'Old Traford'.

Na nkeji nke abụo n'agba nke mbu ka Raheem Sterling mere ka ọ chọro iyija ndị Man Utd mana enweghị ebe ọ gara.

Nkeji nke iri abụọ na atọ ka Man Utd nwetara penariti mgbe Bernardo Silva gbaturu Marecus Rashfor na-etiti ọnụ goolu ndị Manchester City.

Rashford gbara ya were ziga Ederson Aba ebe bọọlụ gawara Abakaliki.

Nke a kpaliri mụọ ndị Man Utd dịka ha bidoro chawa ndị Man City ọkụ.

Anthony Martial mezuru ya goollu abụọ mgbe ọ were shọtụ gbakaa netị ndị ManCity na nkeji nke iri abụọ na itolu.

Manchester City enweteghị onwe ha tupu agbacha agba nke mbu.

Ka agba nke abụọ bidoro, ndị otu a mara onwe ha aka.

Kama Nicolás Otamendi ji isi were mepee neti ndị MandUtd na nkeji iri asato na ise.

ManchesterCity nwara ike ha ma dịka o siri dị nanị otu ndị ga-abu eze na obodo Manchester - Manchester United.

Akụkọ ga-amasị gị