You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Manchester United vs Tottenham: Ole ebuliela Mourinho elu mana ọgọdọ ayọchighi ya anya
Ndi Igbo na-ekwu na nwata bulie nna ya elu, ọgọdọ ayọchie ya anya,
Mana Ole Gunnar Solksjaer gwara Jose Mourinho n'abalị Wenezde na nke a abụghị oge niile.
Ụmụ Manchester United ji ọkpụ goolu atọ a satara otu wee dulaa ndị otu Mourinho bụ Tottenham Hotspur.
Nke a bụ nke mbụ a na-emeri Mourinho kamgbe ọ weghaara ọkwa onye nkuzi bọọlụ ndị Tottenham izu uka abụọ gara aga.
Cheta na Mourinho bụbu onye nkuzi ndị Man Utd tupu a chụọ ya n'afọ gara aga were Solksjaer nọchie anya ya.
Rashford bụ onye nyetere goolu abụọ Man Utd ji merie n'asọmpi ahụ.
N'aka nke ọzọ, Dele Ali nyeteere Tottenham otu mkpụrụ goolu ha ji gbaa aka ahịa.
Mmeri a buliri Man Utd n'ọkwa ndị nke isii na tebulu 'English Premier League'.
N'asọmpi ndị ọzọ, Chelse jikwa ọkpụ goolu abụọ a satara otu wee merie Aston Villa.
Tammy Abraham na Mason Mount bụ ndị nyere ha mmeri a.
Chelsea nọzị n'ọkwa ndị nke anọ ugbua.
Jamie Vardy na James Maddison nyere goolu abụọ ndị Leicester City ji merie Watford.
Ebe Liverpool na agwọ ndị Everton ịba na Anfield.
Asọmpi ha ka na-aga n'ihu ugbua mana Liverpool ji ọkpụ goolu a satara abụọ emeri.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: