You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Arsenal vs Lyon: Ekwe akụọla Arsenal n'isi
Moussa Dembele ji goolu abụọ gbarie ndị Arsenal obi ka ha zutere ịzọ Iko Emirates.
Na Pierre-Emerick Aubameyang nyere otu goolu na nkeji 35 e ji bido bọọlụ azọghị ha n'aka Lyon.
Arsenal nọ na-akpa ike ka goolu mbụ ahụ wụbara na mpio, mana ha amaghị ihe chere ha n'ihu makana Dembele bịara tete n'ụra n'ọkara nke abụọ ma zuo ha ike n'ahụ.
Goolu abụọ nyere Lyon mmeri 2 - 1 ha ji merie, sụbachara na nkeji 66 na nkeji 76.
Gabriel Martinelli Arsenal ka zụrụ azụ chere na ọ gbakpuola goolu mbụ ọ na-enye dịka onye Arsenal ka batara ọhụrụ, mana a gụfuru ya tupu Dembele emewaa ha obi.
N'agbanyeghi na ọ bụ asọmpi enyi na enyi, ọ bụ asọmpi ndị otu egwuregwu ndị ụlọọrụ Emirates na-akwado, na-agba kwa afọ.
Ndị otu egwuregwu abụọ a gbachiri nkịtị ka otu nkeji gafee; iji kwanyere Jose Antonio Reyes nwụrụ anwụ n'ọnwa Juun ugwu.
Ihe nkiri a ga-amasị gị: