You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Barcelona vs Chelsea: Akọọla Barcelona ka ncha nkọta
Ndị Chelsea tiri Barcelona mmọnwụ ka ha na Barcelona zutere n'egwuregwu enyi na enyi ha gbara taa bụ Tuzde, ụbọchị 23 nke ọnwa Julai, 2019.
Goolu abụọ Tammy Abraham na Ross Barkley nyere zuru inye ha mmeri, n'agbanyeghi na Ivan Rakitic mechara sata otu.
Abraham bụ nwaafọ Naịjirịa e binyeburu ndị Derby County (bụ ebe onye nchịkọta Frank Lampard si gafete Chelsea) bu ụzọ gbakaa neetị na nkeji 34.
Barkley tụkwasịrị ọzọ na nkeji 81, iji gosi Barcelona na ha ga-emerinwu ha n'agbanyeghi na onye egwu ha bụ Lionel Messi esoghi gbaa.
Ha zutere n'asọmpi akpọrọ Iko Rakuten, nke ndị mba Japan ebe ụlọọrụ Rakuten dị hibere maka ịgba bọọlụ ndị enyi na enyi tupu afọ egwuregwu bọọlụ ebido n'ike na ebube.
Chelsea zọrọ Barcelona ojukwu n'agbanyeghi na ndị ọhụrụ Barcelona zụtara dịka Antoine Griezmann, Pulisic na ndị ọzọ so gbaa.
Dịka ndị klọb niile na-ahọpụta mba ha ga-anọ agba asọmpi nke ha kwa afọ, Chelsea họpụtara mba Japan iji eme nke afọ a.
Lee ihe Chelsea dere n'elu Twitter ha:
Lekwa ihe nke Barcelona dere na nke ha:
Ihe nkiri a ga-amasị gị: