You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Frank Lampard: Frank Lampard bụzị onye nkuzi Chelsea
Chelsea akpọpụtara aha Frank Lampard, bụ onye nọrọ afọ 13 n'otu egwuregwu ha dịka onye nkuzi ha.
Lampard, dị afọ 41, nọbu achịkọta ndị Derby County tupu a kpọọ ya bịa Chelsea.
Ọn ga-anọchịte Maurizio Sarri, bụ onye si Stamford Bridge n'ọnwa Juun gawa Juventus n'Itali.
Lampard duru ndị Derby gaa mgbacha Iko "Championship" nke ndị Aston Villa nọchịrị ha ụzọ.
Nke ahụ bụ n'ime afọ mbụ ya dịka onye nkuzi bọọlụ.
Onye a bu oney Ingland gbara Chelsea bọọlụ 648 ma soro ha tụọ ugo ugboro 11.
Ọ sị, "Obi dị m ụtọ nlaghachite m laghachiri Chelsea dịka onye nkuzi."
"Mmadụ ncha ma etu m siri hụ Chelsea n'anya nakwa ejem m n'otu egwuregwu."
Lampard ga-abụ onye nkuzi 10 Chelsea Roman Abramovich ga-ewe n'ọrụ kemgbe o goro etu ahụ n'afọ 2003.