You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chelsea vs Man United: A gbaalara Chelsea ụgbọ nwamkpi
Ka ndị Chelsea na-asị "ọzọ emela", ọzọ emeela n'aka otu egwuregwu bọọlụ ọzọ si mpaghara Manchester dị na UK.
Na-erughi izu abụọ Manchester City gwọrọ Chelsea ka abacha, otu Manchester United gosiri Chelsea nkarị ka ha ji ọkpụ goolu abụọ zọpụ ha n'lko FA.
Goolu abụọ Ander Herrera na Paul Pogba nyere n'ọkara nke mbụ, mere ka Chelsea laa "kanaị" na ya bụ asọmpi.
Ka e mechara, oge ndị na-akwado Man Utd malitere ịgụ egwu sị "a ga-achụ Sarri (onye nkuzi Chelsea) n'ụtụtụ", ndị na-akwado Chelsea mechara sonye ha na-agụ ya bụ egwu.
Cheta na Chelsea ga-ezute Manchester City ọzọ n'ụbọchị 24 n'asọmpi Iko Carabao, mana isi ha a ga-apụta na ya?
Akụkọ ga-amasị gị: