APC Caucus meeting: Nyụọnụ onye ọbụla ga-anapụ igbe vootu n'ike ịkpakwụ - Buhari

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọbụla napụrụ igbe ntuliaka maọbụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ji ndị agboro akpa ike n'oge ntuliaka na-abịa ga-atunye ndụ ya.

Buhari onye kwuru nke a n'ọgbakọ imeụlọ APC nwere N'Abuja n'ehihe Monde sịrị na ya enyela iwu ndị ọrụ nchekwa ka nyụọ onye ọbụla ga-anapụ igbe vootu n'ike ịkpakwụ.

"Agwala m ndị ọrụ nchekwa na onye ọbụla napụrụ igbe vootu na ntuliaka maọbụ onye ndọrọndọọ ọchịchị ji ndị agboro kpa ike, ha merela ya ebere ma ncha."

"Achọrọ m ka a kwanyere ụmụ Naijiria ugwu, hapụ ha ka ha tụnyere onye masịrị ha."

N'okwu gbasara nhighari Inec higharịrị ntuliaka, Buhari kwuru na o nweghị nkọwa ọbụla ha nyere ga-adaba n'ihi na ha nwere ogologo oge nakwa ego iji rụọ ọrụ ha dịka o kwesịri.

"Inec nwere oge na ego dị mkpa iji rụọ ọrụ ha nke na ịma ọkwa nhigharị ahụ naanị awa isii tupu ntuliaka enweghị ihe ha ga-eji agọpụ isis onwe ha n' arụghị ọrụ ka dịka o kwesịrị.

Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-enyocha ihe mere ma e mecha ntuliaka.

N'okwu ya onyeisioche APC bụ Adams Oshiomhole kwuru na o nweghị ihe Inec ga-eji gọpụta isi onwe ya n'ihe mere, ma kpo oku ka e nyocha mata ndị kụrụ ụgba ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị: