You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ronaldo ọ bụbu ide ji Real Madrid?
Atletico Madrid ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ pịa ogbo ha bụ Real Madrid ụtalị iji mabute Uefa Super Cup n'asọmpi ha gbara n'abalị.
Asọmpi a bụ nke mbụ gbapụtara ihe ndị Real Madrid na-agba kamgbe ha rere Cristiano Ronaldo baa n'aka Juventus.
Nke a mere ọtụtụ ndị nkwado otu Real Madrid jiri bee m makwara a ghara ire Cristiano Ronaldo.
Ebe ndị ọzọ hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya na-ajụ ajụjụ sị "Ronaldo ọ bụ ide ji Real Madrid?"
Cheta na Ronaldo bụ onye nọrọ afọ itoolu na Real Madrid gafere Juventus n'ọnụ ego dị nde yuro otu narị n'izuụka ole na ole gara aga.
Ronaldo mabutere Iko Uefa Champions League anọ mana mmekọrịta ya na onyeisi otu real Madrid bụ Florentino Perez, adịchaghị mma n'oge ya na Madrid.
N'okwu Ronaldo, "Oge abịala imepe ọgbọ ndụ ọhụrụ na ndụ m, ọ bụ ya mere m ji sị otu bọọlụ a nabata orire m."