Liverpool, Roma, Real Madrid na Bayern Munich na-akwado asọmpi

Ọsọ ihu ọnọdụ ikpeazu n'asọmpi UEFA Champions League ebidola.

N'asọmpi ọkara-ịkpeazụ na-abịa, Bayern Munich na Real Madrid, Liverpool na Roma na-akwado ịsọ mpị egwuregwu nke mbụ ga-eme ka amara onye ga-emeri ma gafee n'asọmpi ikpeazụ.

Liverpool na Roma ga-asọ mpi ha echi bụ ụbochị 24, Bayern Munich na Real Madrid ga-asọmpi n'ụbọchị 25 n'ime ọnwa a.

Kenneth Umerie bụ onye ọkachamara n'egwuregwu bọọlụ gwara BBC Igbo na asọmpị a ga-ekpo ọkwụ.

Mana o kwuru na Liverpool nwere ike imeri Roma n'asọmpi a makana oteela otu ọbụla meriri Liverpool n'ụlọ ha.

O kwuru na Mohamed Salah, Sadio Mané na Roberto Firmino ka na-eme nke ọma n'otu Liverpool.

N'asọmpị Bayern Munich na Real Madrid.

Umerie kwuru na Bayern Munich na Real Madrid na-eme ihe siriike. Ihe pụtara na ọ ga-dị ọrụ ị ma ka asọmpị a ga-aga.

Ugbua, Bayern Munich emeriela Bundusliga nke afọ a, nke a akpaliteela mmụọ ha, ma nye ha olileanya na ha ga-eru ikpeazu n'asọmpị Champions League.

Asọmpi nke ikpeazu Champions League ga-eme n'ụbọchị 26 n'ime onwa Mee.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: