You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Man United agafela n'agba ikpeazụ asọmpi iko FA
Ndị Tottenham buru ụzọ nye goolu tupu Man United e si na-azụ bịa sa ya ma merie ha n'asọmpị ahụ.
Onye nyere Tottenham goolu bụ Dele Alli n'ime nkeji iri na otu.
N'ime nkeji iri abụọ na anọ, Alexis Sanchez nke Manchester United sara ọkpụ goolu ahụ, tutu ha ga-ezuike.
N'ime agba nke abụọ ha lọtara ezumike, asọmpi ahụ bịara sie ike nke ukwuu.
Akụkọ ga-amasị gị:
Mgbe o ruru nkeji iri isii na abụọ, Ander Herrera nke Manchester United sụnyere ọkpụ goolu nke abụọ.
Alexis Sanchez bụ onye kacha apụta ihe n'asọmpi ahụ nke akpọrọ "Man of the match".
Manchester United kpachiri na-ekweghị ka enye ha goolu ọzọ rue mgbe asọmpi ahụ gụrụ.
Nke a pụtara na Manchester United etozuola oke ịgba asọmpi nke ịkpeazụ nke iko FA.
Ha na-atụ anya ezute onye ga-enweta mmeri n'etiti Chelsea na Southampton.
Lee ihe ụfọdụ ndị Man United na-ekwu n'akara tuwitta: