You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Asompi CW: Naijiria nwetara ọlaedo 9, ọlaocha 9
Egwuregwu Commonwealth ọgbọ 21 nke Gold Coast mba Ụstrelịa abịala na ngụcha.
Mba mpaghara Afrịka so n'egwuregwu a gụnyere Saụt Afrịka, Naịjirịa, Kenya, Yuganda, Botswana, Namibịa, Kameruun, Ghana, Malawi na dị ọzọ.
Ụfọdụ ndị mere nkeọma dịka Saụt Afrịka, Naịjirịa na Kenya, ebe ndị ọzọ atagbutaghị ihe ọ bụla.
Naịjirịa bụ ndị abụọ n'Afrịka mabụrụ ndị itoolu n'ọkwa ihe nrite mba Commonwealth dịka ha ji ọlaedo itoolu, ọlaocha itoolu na ọlanchara isii.
Mba Saụt Afrịka kachasị mee nkeọma n'Afrịka dịka ha ritere ọlaedo iri na atọ, ọlaocha iri na otu na ọlanchara iri na atọ nke mere ha ndị isii n'ọkwa ihe nrite.
Mba Kenya jiri ọlaedo ano, ọlaocha asaa na bronzu isii na-esote Naịjirịa, ebe Yuganda nwetere ọlaoedo atọ, ọlaocha otu na ọlanchara abụọ.
Mana ndị kachasị mee nkeọma n'ụwa niile bụ ndị Ọstrelịa bụ ebe a na-eme egwuregwu ahụ.
Ha ritere goldu iri asatọ, sịlva iri ise na itoolu, ọlanchara iri ise na itoolu.
England na-esote ha ritere ọlaedo iri ano na ise, ọlaocha ano na ise, na ọlanchara iri ano na isii.
Mba Indịa jiri ọlaedo iri abụọ na isii, ọlaocha iri abụọ na ọlanchara iri abụo bụrụ ndị atọ n'ogo ihe nrite