You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Commonwealth Games 2018: Hawkins adaala
Nwa amadị Scotland bụ Callum Hawkins gbara afọ iri abụọ na ise, onye gara inweta ọlaeedo ma ọbụrụ nọ o ruru na ngwụcha, a dala yọkọm n'ụzọ.
Agbanyeghị 'ọnọdụ ekpomọkụ dị na mba Gold Coast, Hawkins ji nkeji abụọ gacha ndị ọzọ nke bụ na ọ gara inweta ọlaedo mana ụkwụ bidoro ịsọ ya ngọngọ tupu ya ada n'akụkụ ụzọ.
O biliri ma ga n'ihu na-agbakwa ọsọ ọtụtụ nari mita tupu ọ da ọzọ kụọ isi n'ala.
Hawkins mụ anya oge nke a mechara ma bilie na-ekwu okwu dịka e bubara ya n'ụgbọ nleta ahụike nke a kpọrọ 'Ambulance' na bekee.
Akwụkwọ ọzi nke ndị otu egwuregwu mba Scotland wepụtara kwuru sị: " E bugara Callum ụlọọgwụ dịka ọ dachara iji nyocha ya dịka e si eme ya. Obi dị anyị ụtọ ịgwa ụnụ na o kuliela, ebe ya na nna ya na ndị ọrụ nleta na-enwe mkparitaụka.
"A na-eme ya nyocha n'ihi adịghị amaama. Anyị na-ekpere ya ekpere ka ọ dịkwa mma ọsọ ọsọ."
Peter Jardine nke Scottish Athletics kwara BBC na Scotland na Hawkins, onye gbarala ọsọ ihe karịrị elekere abụọ, "jụburu ka enye ya nleta ahụike oge ọ dara n'ihi na ọ na-atụ uche nke a ga-eme ka agụpụ ya n' asompi ahụ".
O were nkeji ole na ole tupu ndị nleta ahụike erute nyere nwa amadi ahụ aka nke mere ka onye ntaakụkọ egwuregwu BBC bụ Steve Cram sị na ọ bụ "ihe ihere".
Akụkọ ndị ga-amasị gị: