You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Atụọla ogbunigwe n'ụlọọrụ ngwaagha kemịkal dị na Sirịa
Mba Amerịka, Uk na Fransị agbala ogbunigwe n'ọtụtụ ụlọọrụ ngwaagha kemịkal nke gọọmentị Sirịa nwere.
Mwakpo a bụ na nzaghachị mwakpo a sịrị na Sirịa jiri ngwaagha kemịkal mee n'obodo Douma nke dị na Sirịa na izuụka gara aga.
Ogbunigwe dara n'isi obodo bụ Damascus, nakwa ebe abụọ ọzọ dị na mpaghara Homs dịka Pentagon kwuru.
Onye nnọchite anya mba Rọshịa na Amerịka zaghachịrị ma kwuo na mwakpo a emere ndị enyi ha "agaghị abụ ihe efu".
"Mba Briten, Fransị na Amerịka egosila ike nke ezi omume ha megide nkwarụ na obi ọjọọ" Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump kwuru.
"Mwakpo a bụ iji guzosie ike n'imegide nrụpụta, mgbasa na iji ngwaagha kemịkal awakpo," dịka o kwuru.
Mwakpo a bụ nke kachasị gbapụta ihe ndị ndu mpaghara ọdịdị anyanwụ na-eme kamgbe onyeisiala Sirịa Bashar al-Assad.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu;
Onyeisila mba Sirịa bụ Bashar al-Assad ekwuola na mwakpo ga-eme ka Sirịa dị kwuo ike n'ibuso ndị na-eyi ndụ egwu agha.
Assad boro ndị gọọmenti Amerịka na ndị ọzọ ebubo na ha na-akwado ihe iyi ndụ egwu.
Gere ihe ndị mm