You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Uefa: Ihe ịtụ n'anya onwere ike ime Madrid?
N'asọmpi Uefa champịọns ụnyaahụ, ihe ịtụ n'anya mere Barcelona mgbe ndị Roma gbapụrụ ha n'asọmpi Uefa champịọns.
Ndị Barcelona jiri ọkpụ anọ asatara otu merie Roma n'ụkwụ mbụ nke asọmpi ahụ, ebe Roma n'ihe iju anya jiri ọkpụ atọ chara acha merie ma gbapụ ha.
Ajụjụ a bụrụ, ihe mere ndị Barcelona onwere ike ime ndị Real dịka ha ga-ezute ndị Juventus n'abalịa.
Real Madrid ji ọkpụ atọ asataghị otu merie ndị Juventus n'ụlọ ha n'ụkwụ mbụ nke asọmpi ahụ.
Juventu ga-enyeru Real Madrid ọkpụ atọ agaghị asata otu iji merie ma gbapụ ha n'asọmpi nke abalịa.
N'aka nke ọzọ, Bayern Munich ga-ele ndị Sevilla bụ ndị ha jiri ọkpụ abụọ asatara otu merie n'ụkwụ nke mbụ ọbịa n'ụkwụ nke abụọ taa.
A na-atụ anya ma otu ihe ịtụ n'anya ahụ ọ ga-emekwa ọzọ n'abalịa mgbe ndị otu a ga-ezute ibe ha.